3 Ya mere, ha nọtụrụ ogologo oge na-ekwu okwu n’atụghị egwu site n’ikike Jehova, bụ́ onye gbara akaebe banyere okwu nke obiọma ya na-erughịrị mmadụ site n’inye ha ikike ime ihe ịrịba ama na ihe ebube.+
12 N’ihi nke ahụ, ìgwè mmadụ ahụ dum gbachiri nkịtị, ha malitekwara ige Banabas na Pọl ntị ka ha na-akọ ọtụtụ ihe ịrịba ama na ihe ebube Chineke mere site n’aka ha n’etiti ndị mba ọzọ.+
19 site n’ike nke ihe ịrịba ama na ihe ebube,+ site n’ike mmụọ nsọ; nke mere na, malite na Jeruselem+ gazuo Ilirikọm, ekwusawo m ozi ọma banyere Kraịst nke ọma.+