17 Ma, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa: n’ezie, ndị nketa nke Chineke, ma bụrụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe,+ ma ọ bụrụhaala na anyị na ya atakọọ ahụhụ+ ka e wee mee ka anyị na ya nwekọọ ebube.+
6 ya bụ, na ndị mba ọzọ kwesịrị ịbụ ndị anyị na ha na-eketakọ ihe na ndị so bụrụ akụkụ nke ahụ́+ ahụ na ndị so anyị na-eketa nkwa+ ahụ n’ịdị n’otu nke anyị na Kraịst Jizọs site n’ozi ọma ahụ.
7 Unu ndị bụ́ di, ka unu na ndị nwunye unu na-ebi otú ahụ+ dị ka ihe ọmụma si dị,+ na-enyenụ nwaanyị nsọpụrụ+ dị ka arịa na-esighị ike, ebe unu na ha bụ ndị nketa+ nke ihu ọma na-erughịrị mmadụ nke bụ́ ndụ, ka e wee ghara igbochi ekpere unu.+