30 Ma ọ bụ n’ihi ya ka unu na Kraịst Jizọs ji dị n’otu, bụ́ onye ghọọrọ anyị amamihe+ nke si n’aka Chineke, ghọọkwara anyị ezi omume+ na ịdị nsọ+ na ntọhapụ site n’ihe mgbapụta;+
16 Kwenụ ka okwu nke Kraịst biri n’ime unu n’ụba, ka o meekwa ka unu nwee amamihe niile.+ Jirinụ abụ ọma+ na otuto a na-enye Chineke na abụ ime mmụọ+ na amara na-ezi ibe unu ihe,+ na-adụkwa ibe unu ọdụ, na-abụkunụ Jehova abụ n’ime obi unu.+