11 N’ihi na ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye dara ogbenye n’ala gị.+ Ọ bụ ya mere m ji na-enye gị iwu, sị, ‘Mesapụrụ nwanne gị aka, bụ́ onye nọ n’ahụhụ, nke dakwara ogbenye n’ala gị.’+
5 Ma nwaanyị nke bụ́ nwaanyị di ya nwụrụ n’ezie na onye nọ n’ụkọ+ etinyewo olileanya ya n’ebe Chineke nọ,+ ọ na-arịọsikwa arịrịọ ike ma na-ekpe ekpere abalị na ehihie.+
27 Ụdị ofufe nke dị ọcha,+ nke a na-emerụghịkwa emerụ+ n’ụzọ Chineke bụ́ Nna anyị si ele ihe anya bụ: ilekọta ụmụ mgbei+ na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ+ ná mkpagbu ha,+ na mmadụ idebe onwe ya ka ọ ghara inwe ntụpọ+ site n’ụwa.+