12 N’ihi nke ahụ, m ga-ekenye ya òkè n’etiti ọtụtụ ndị,+ ọ bụkwa ya na ndị dike ga-eke ihe a kwatara n’agha,+ n’ihi na ọ wụpụụrụ ọnwụ mkpụrụ obi ya,+ a gụnyekwara ya ná ndị na-emebi iwu;+ ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ ndị,+ ọ gbachiteere ndị na-emebi iwu.+
7 Wepụnụ ihe iko achịcha ochie ahụ, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta,+ dị ka unu bụ ihe na-ekoghị eko. N’ihi na, n’ezie, a chụwo+ nwa atụrụ ememme ngabiga+ anyị n’àjà, ya bụ, Kraịst.+