16 “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya+ nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya,+ ka e wee ghara ibibi+ onye ọ bụla nke nwere okwukwe+ na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.+
17 n’ihi na ọ bụ na ya ka a na-ekpughe ezi omume nke Chineke+ n’ihi okwukwe+ mmadụ nwere, nke na-eme ka o nwekwuo okwukwe, dị nnọọ ka e dere, sị: “Ma onye ezi omume ga-esi n’okwukwe dị ndụ.”+