11 Na narị afọ nke isii ná ndụ Noa, n’ọnwa nke abụọ, n’abalị iri na asaa n’ọnwa ahụ, n’ụbọchị ahụ, a gbaghere isi iyi niile nke nnukwu ogbu mmiri, e meghekwara ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe.+
23 O wee si otú a kpochapụ ihe ọ bụla dị ndụ n’elu ala, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ, ruo n’anụ na-agagharị agagharị, ruokwa n’anụ ufe nke eluigwe, e kpochapụrụ ha n’ụwa;+ ọ bụ naanị Noa na ndị ya na ha nọ n’ụgbọ lanahụrụ.+
9 “Nke a dị m nnọọ ka ụbọchị Noa.+ Dị nnọọ ka m ṅụrụ iyi na mmiri Noa agaghị ekpuchi ụwa ọzọ,+ otú ahụ ka m ṅụrụ iyi na agaghị m eweso gị iwe, agaghịkwa m abara gị mba.+