12“N’oge ahụ, Maịkel+ ga-ebili, bụ́ nnukwu onyeisi+ ahụ nke guzo ọtọ+ n’ihi ụmụ ndị gị.+ A ga-enwekwa oge ahụhụ nke a na-enwetụbeghị kemgbe e nwere mba ruo n’oge ahụ.+ N’oge ahụ, ndị gị ga-alanahụ,+ onye ọ bụla e dere aha ya n’akwụkwọ.+
5 A ga-esikwa otú ahụ yiwe onye meriri emeri+ uwe elu nke na-acha ọcha;+ m gaghịkwa ehichapụ aha ya ma ọlị n’akwụkwọ nke ndụ,+ kama m ga-ekwupụta aha ya n’ihu Nna m+ na n’ihu ndị mmụọ ozi ya.+
27 Ma ihe ọ bụla na-adịghị nsọ na onye ọ bụla nke na-eme ihe arụ,+ nke na-aghakwa ụgha,+ agaghị abanye n’ime ya ma ọlị;+ ọ bụ naanị ndị e dere aha ha n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ nke Nwa Atụrụ ahụ ga-abanye n’ime ya.+