3 N’ihi na mmanya nke iwe nke ịkwa iko ya enwetawo mba niile,+ ya na ndị eze nke ụwa kwakwara iko,+ ndị ahịa+ nke ụwa bakwara ọgaranya n’ihi ndụ okomoko gabigara ókè ọ na-ebi n’enweghị ihere ọ bụla.”+
9 “Ndị eze+ ụwa, ndị ha na ya kwara iko, biekwa ndụ okomoko n’emeghị ihere, ga-akwara ya ákwá, tiekwa aka n’obi wee ruoro ya uju,+ mgbe ha ga na-ele anwụrụ ọkụ+ nke si n’ọkụ a na-akpọ ya,