Job
36 Elaịhu wee gaa n’ihu ikwu, sị:
2 “Nwetụkwuoro m ndidi, m ga-agwakwa gị
Na ọ ka dị ihe m ga-ekwu banyere Chineke.
5 Lee! Chineke dị ike,+ ọ gaghịkwa ajụ mmadụ;
Ọ dị ike ná nghọta nke obi ya;
6 Ọ gaghị ahapụ onye ajọ omume ọ bụla ndụ,+
Ma ọ ga-ekpe ndị nọ n’ahụhụ ikpe ziri ezi.+
7 Ọ gaghị ewepụ anya ya n’ahụ́ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume;+
Ọbụna ndị eze nọ n’ocheeze+—
Ọ ga-emekwa ka ha nọrọ n’ocheeze ruo mgbe ebighị ebi, a ga-ebulikwa ha elu.
9 Mgbe ahụ, ọ ga-akọrọ ha banyere otú ha si eme omume
Nakwa njehie ha, n’ihi na ha na-ebuli onwe ha elu.
11 Ọ bụrụ na ha erube isi ma jeere ya ozi,
Ha ga-enweta ihe ọma n’oge ndụ ha niile
Bizuokwa ndụ ha n’obi ụtọ.+
13 Ndị si n’ezi ofufe dapụ n’ime obi ha na-akpadoro onwe ha iwe.+
Ha agaghị eti mkpu enyemaka ọbụna ma o kee ha agbụ.
14 Mkpụrụ obi ha ga-anwụ mgbe ha bụ okorobịa,+
Ha ga-anwụkwa n’etiti ndị ikom bụ́ ndị akwụna ụlọ arụsị.+
15 Ọ ga-anapụta onye nọ n’ahụhụ n’ahụhụ ya,
Ọ ga-emeghekwa ntị ha mgbe a na-emegbu ha.
16 Ọ ga-anapụtakwa gị n’ọnụ ahụhụ!+
Ị ga-anọ n’ebe sara mbara karị,+ nke na-adịghị mkpagide,
Ngụgụ obi nke dị na tebụl gị ga-ejupụtakwa n’abụba.+
18 Lezie anya ka ọnụma+ ghara ịraba gị n’iji obi ilu na-akụ aka,
Ekwekwala ka ihe mgbapụta+ buru ibu dufuo gị.
19 Ọ̀ dị ihe mkpu enyemaka ị na-eti ga-arụpụta?+ Ee e, ọ dịghịkwa ihe
Oké mgbalị gị niile ga-arụpụta n’oge ahụhụ.+
20 Atụsila anya abalị ike,
Bụ́ mgbe ndị mmadụ na-esi n’ebe ha nọ agbaghachi azụ.
22 Lee! Chineke ji ike ya eme ihe n’ụzọ dị ebube;
Olee onye ozizi dị ka ya?
23 Ọ̀ dịwo onye mere ka ọ zaa ajụjụ banyere ihe o mere,+
Ọ̀ dịwokwa onye sịrị ya, ‘I meela ihe ọjọọ’?+