12 Ọ gwara ya ihe ndị e si n’ike mmụọ nsọ gwa ya gbasara otú a ga-esi arụ ihe niile banyere ogige+ ụlọ Jehova, ụlọ ndị a ga-anọ na-eri ihe, ebe a ga na-edowe akụ̀ ndị ga-adị n’ụlọ ezi Chineke, na ụlọ a ga na-edowe akụ̀ ndị e doro nsọ.+
5 Ozi dị nsọ ha na-eje bụ ihe atụ, ọ nọchikwara anya+ ihe ndị dị n’eluigwe.+ Ihe gosiri nke a bụ ihe Chineke nyere Mosis n’iwu mgbe ọ chọrọ ịrụ ụlọikwuu ahụ. Chineke sịrị ya: “Hụ na ị rụrụ ihe niile ka ha dị ka ihe ndị e gosiri gị n’ugwu.”+
9 Ụlọikwuu a bụ ihe atụ maka oge a.+ A ka na-enyekwa onyinye ma na-achụ àjà otú e kwuru ka a na-eme.+ Ma, ihe ndị a anaghị emeli ka akọnuche onye na-eje ozi dị nsọ zuo okè.+