-
Ọpụpụ 29:26, 27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 Werezie okpuru afọ* ebule ahụ e ji ahọpụta ndị nchụàjà,+ bụ́ nke a chụrụ n’àjà maka Erọn, ma fegharịa ya ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova. Ọ ga-abụzi òkè gị. 27 Ị ga-eme ka okpuru afọ* anụ ahụ e ji chụọ àjà a na-efegharị efegharị dị nsọ, ya na ụkwụ anụ ahụ bụ́ òkè dị nsọ e fegharịrị efegharị nke si n’ebule e ji ahọpụta ndị nchụàjà,+ bụ́ nke a chụrụ n’àjà maka Erọn na ụmụ ya ndị nwoke.
-
-
Levitikọs 7:34, 35Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
34 N’ihi na m na-anara ndị Izrel okpuru afọ* anụ e ji chụọ àjà a na-efegharị efegharị nakwa ụkwụ anụ bụ́ òkè dị nsọ nke si n’àjà udo ha. M na-ewerekwa ha nye Erọn onye nchụàjà na ụmụ ya ndị nwoke ka ọ bụrụ iwu ga-adịgide adịgide ndị Izrel ga na-edebe.+
35 “‘Ihe a bụ òkè si n’àjà a na-esu ọkụ a chụụrụ Jehova, nke e wepụtaara ndị nchụàjà, ya bụ, Erọn na ụmụ ya ndị nwoke, n’ụbọchị ọ họpụtara ha ka ha bụrụ ndị nchụàjà Jehova.+
-