Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọpụpụ 23:16
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 16 Ị ga-emekwa Ememme Owuwe Ihe Ubi* nke mkpụrụ mbụ kara aka ị rụtara ná mkpụrụ ị ghara n’ubi.+ Ị ga-emekwa Ememme Ịchịkọbata Ihe* ná ngwụcha afọ, mgbe i si n’ubi na-ewebata ihe ị rụtara.+

  • Levitikọs 23:34-36
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 34 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘N’abalị iri na ise n’ọnwa asaa ahụ, unu ga-amalite Ememme Ụlọ Ndò a na-emere Jehova. Unu ga-eme ya ruo ụbọchị asaa.+ 35 Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ n’ụbọchị nke mbụ. Unu agaghịkwa arụ ọrụ ọ bụla siri ike. 36 Unu ga-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ ruo ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu ga-achụkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ. Ọ bụ nzukọ pụrụ iche. Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike.

  • Diuterọnọmi 16:13-15
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 13 “Unu ga-eme Ememme Ụlọ Ndò+ ụbọchị asaa mgbe unu si n’ebe unu na-azọcha ọka* na ebe unu na-azọchapụta mmanụ nakwa n’ebe unu na-azọchapụta mmanya na-ebubata ihe ubi unu mepụtara. 14 Unu ga-aṅụrị ọṅụ n’oge ememme unu,+ unu na ụmụ unu ndị nwoke, ụmụ unu ndị nwaanyị, ohu unu ndị nwoke, ohu unu ndị nwaanyị, onye Livaị, onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna, nakwa nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ ndị bi n’obodo unu. 15 Ụbọchị asaa ka unu ga-emere Jehova bụ́ Chineke unu ememme+ n’ebe Jehova ga-ahọrọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu ga-agọzi ihe niile ala unu mepụtara nakwa ihe niile unu na-eme.+ Unu ga na-aṅụrị naanị ọṅụ.+

  • Nehemaya 8:14-18
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 14 Ha wee chọpụta na e dere n’Iwu ahụ Jehova si n’aka Mosis nye ndị Izrel na ha ga-ebi n’ụlọ ndò n’oge ememme ha na-eme n’ọnwa nke asaa,+ 15 nakwa na ha ga-akọsa+ ma kwusaa n’obodo ha niile nakwa na Jeruselem niile, sị: “Gaanụ n’ebe bụ́ ugwu ugwu gbute akwụkwọ osisi oliv, akwụkwọ osisi paịn,* akwụkwọ osisi metụl* na igu nkwụ, nakwa akwụkwọ osisi ndị ọzọ nwere alaka a ga-eji rụọ ụlọ ndò, otú e dere ya.”

      16 Ndị mmadụ gara gbute ihe ndị ahụ ka ha jiri ha rụọrọ onwe ha ụlọ ndò n’elu ụlọ ha, n’ogige ha, n’ogige dị n’ụlọ ezi Chineke,+ n’ámá Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri,+ nakwa n’ámá Ọnụ Ụzọ Ámá Ifrem.+ 17 Ọgbakọ ahụ niile, bụ́ ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, wee rụọ ụlọ ndò ma biri n’ụlọ ndò ndị ahụ n’ihi na ndị Izrel emetụbeghị ememme a otú a malite n’oge Joshụa+ nwa Nọn ruo n’ụbọchị ahụ. Ha wee ṅụrịa nnukwu ọṅụ.+ 18 Kwa ụbọchị, a na-agụpụta ihe dị n’akwụkwọ Iwu ezi Chineke+ malite n’ụbọchị mbụ ruo n’ụbọchị ikpeazụ. Ha mere ememme ahụ ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, e nwere nzukọ pụrụ iche otú e kwuru ka a na-enwe.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya