31 “Ị ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà mgbochi.+ A ga-akpa ndị cherob na ya.
2 Jehova gwara Mosis, sị: “Gwa Erọn nwanne gị nwoke na ọ bụghị mgbe ọ bụla ka ọ ga na-abata n’ebe nsọ,+ n’ime ebe ahụ e gechiri ákwà mgbochi,+ n’ihu okwuchi Igbe ahụ, ka ọ ghara ịnwụ,+ n’ihi na m ga na-apụta n’ígwé ojii+ n’elu okwuchi+ Igbe ahụ.