-
Ndị Hibru 9:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Ụlọikwuu a bụ ihe atụ maka oge a.+ A ka na-enyekwa onyinye ma na-achụ àjà otú e kwuru ka a na-eme.+ Ma, ihe ndị a anaghị emeli ka akọnuche onye na-eje ozi dị nsọ zuo okè.+ 10 E nweghị ihe ọzọ dị n’onyinye na àjà ndị ahụ ma ọ́ bụghị naanị okwu gbasara ihe oriri na mmanya na ụzọ dị iche iche e si eme ka ihe dị ọcha.*+ Ha bụ iwu e nyere gbasara ahụ́.+ A chọkwara ka a na-edebe ha ruo oge a ga-eme ka ihe ka mma.
-
-
Ndị Hibru 9:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 N’ihi na ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oké ehi+ na ntụ ehi e fesara ndị na-adịghị ọcha na-edo ha nsọ ma mee ka ahụ́ ha dị ọcha,+ 14 o doro anya na ọbara Kraịst ga-eme ihe karịrị ihe ọbara ndị ahụ mere.+ Mmụọ ebighị ebi duziri ya, ya enyefee Chineke onwe ya ka àjà a na-emerụghị emerụ. Ọbara ya na-asachapụ ọrụ dị iche iche na-abaghị uru* n’akọnuche anyị+ ka anyị wee na-ejere Chineke dị ndụ ozi dị nsọ.+
-