-
Ọnụ Ọgụgụ 21:23, 24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
23 Ma Saịhọn ekweghị ka ndị Izrel si n’ala ya gafere. Kama Saịhọn kpọkọtara ndị obodo ya niile gawa ịlụso Izrel agha n’ala ịkpa. Ọ bịarutere Jehaz malite ịlụso Izrel agha.+ 24 Ma ndị Izrel ji mma agha merie ya+ ma weghara ala ya+ malite n’Anọn+ ruo Jabọk,+ n’ebe dị ndị Amọn nso, n’ihi na ọ bụ Jeza+ bụ ókè ndị Amọn.+
-
-
Joshụa 12:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Ndị a bụ ndị eze chịrị ala ndị Izrel meriri, ndị ha weghaara ala ha dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, malite na Ndagwurugwu Anọn+ ruo n’Ugwu Hemọn,+ nakwa Araba niile nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ:+ 2 Saịhọn+ eze ndị Amọraịt, onye biri na Heshbọn. Ọ chịrị Aroa+ nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn.+ Ọ bụkwa ya chịrị malite n’etiti ndagwurugwu ahụ ruo na Ndagwurugwu Jabọk. Ọ chịkwara ọkara Gilied. Ndagwurugwu Jabọk bụkwa ókè ala ndị Amọn.
-