11 Mgbe e mechara, mmụọ ozi Jehova bịara+ nọrọ ọdụ n’okpuru nnukwu osisi dị n’Ọfra, bụ́ nke Joash onye Abi-iza.+ Gidiọn+ nwa ya nọ na-eticha ọka wit n’ebe a na-azọchapụta mmanya ka o zoo ọka ahụ ka ndị Midian ghara ịhụ ya.
27 Gidiọn ji ọlaedo ndị ahụ mee efọd,+ dowekwa ya n’ihu ọha n’obodo ya bụ́ Ọfra.+ Izrel niile wee kpaa àgwà ka ndị akwụna, hapụ Chineke gaa fewe efọd ahụ n’ebe ahụ.+ O wee bụụrụ Gidiọn na ezinụlọ ya ọnyà.+