2 Ahụkwara m ịnyịnya na-acha ọcha.+ Onye na-agba ya jikwa ụta. E nyekwara ya okpueze,+ ya agaa ka ọ na-emeri ndị iro ya nakwa ka o merie ha ruo n’isi.+
11 Ahụrụ m ka e meghere eluigwe, hụkwa otu ịnyịnya ọcha+ dị ebe ahụ. A na-akpọkwa onye na-agba ya Onye E Kwesịrị Ịtụkwasị Obi+ na Onye Eziokwu.+ Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, na-alụkwa agha kwesịrị ekwesị.+
15 Ogologo mma agha dị nkọ sikwa n’ọnụ ya pụta.+ Ọ ga-eji ya gbuo mba niile. Ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè taa ha ahụhụ.*+ Ọ na-azọchakwa mkpụrụ dị n’ebe a na-azọchapụta mmanya nke nọchiri anya iwe dị ọkụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+