-
Jeremaya 9:25, 26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 Jehova kwuru, sị, “Oge na-abịa mgbe m ga-eme ka ndị niile e biri úgwù, ma, ha aka bụrụ ndị a na-ebighị úgwù, zaa ajụjụ ihe ha mere,+ 26 ya bụ, ndị Ijipt,+ ndị Juda,+ ndị Ịdọm,+ ndị Amọn,+ ndị Moab,+ na ndị niile na-akpụ ajị ndị dị n’akụkụ ntị ha abụọ, bụ́ ndị bi n’ala ịkpa.+ N’ihi na mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị úgwù, ndị Izrel niile bụkwa ndị a na-ebighị úgwù n’obi.”+
-