16 Ma, ha ji ndị ozi ezi Chineke+ na-eme ihe ọchị. O nweghịkwa ihe ha ji okwu ya kpọrọ.+ Ha nọ na-akwa ndị amụma ya emo+ ruo mgbe hanwa na-akwa emo na-enweghịzi mmekwata. Mgbe ahụzi ka Jehova wesara ha ezigbo iwe.+
52 Ò nwere onye amụma nna nna unu hà na-akpagbughị?+ Ha gburu ndị mara ọkwa na e nwere onye ezi omume na-abịa.+ Ọ bụ onye ahụ ka unu raara nye ma gbuo n’oge na-adịbeghị anya.+
37 A tụrụ ha nkume,+ a nwara ha ọnwụnwa, a kwọbiri ha abụọ, e ji mma agha gbuo ha,+ ha na-eyi akpụkpọ atụrụ na akpụkpọ ewu.+ E nwere mgbe ha nọ n’ụkọ, a kpagburu ha,+ e megburu ha.+