-
Matiu 12:9-14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Mgbe o si ebe ahụ pụọ, ọ banyere n’ụlọ nzukọ ha. 10 Ma, e nwere otu nwoke otu aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ.+ Ụfọdụ ndị wee jụọ Jizọs ajụjụ iji nweta ebubo ha ga-ebo ya.+ Ha jụrụ ya, sị, “È kwesịrị ịgwọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike?” 11 O wee sị ha: “Ọ bụrụ na otu onye n’ime unu nwere otu atụrụ, atụrụ ahụ adaba n’olulu n’Ụbọchị Izu Ike, ọ́ gaghị aga dọpụta ya?+ 12 O doro anya na mmadụ bara uru karịa atụrụ. N’ihi ya, iwu kwuru ka a na-eme ihe dị mma n’Ụbọchị Izu Ike.” 13 Ọ gwaziri nwoke ahụ, sị: “Gbatịa aka gị.” O wee gbatịa ya, ya adị mma ka aka nke ọzọ. 14 Ma ndị Farisii pụrụ wee gbaa izu otú ha ga-esi gbuo ya.
-
-
Luk 6:6-11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 N’ụbọchị izu ike ọzọ,+ ọ banyere n’ụlọ nzukọ ma malite izi ihe. E nwekwara otu nwoke aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọ ebe ahụ.+ 7 Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ na-ele Jizọs anya ka ha hụ ma ọ̀ ga-agwọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike, n’ihi na ha na-achọ ihe ha ga-eji bo ya ebubo. 8 Ma, ọ ma ihe ha na-atụgharị n’uche.+ N’ihi ya, ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Bilie, guzoro n’etiti.” O wee bilie guzoro ebe ahụ. 9 Jizọs sịziri ha: “Ka m jụgodị unu, Iwu ò kwuru ka a na-eme ihe ọma n’Ụbọchị Izu Ike ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ, ịzọ ndụ* ka ọ̀ bụ ibibi ya?”+ 10 Mgbe o lechara ha niile anya, ọ sịrị nwoke ahụ: “Gbatịa aka gị.” O wee gbatịa aka ya, aka ya adị mma. 11 Ma ezigbo iwe were ha, ha amalite ịgba izu ihe ha ga-eme Jizọs.
-