-
Daniel 7:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 “Anọ m na-ele ihe na-eme n’ọhụụ m nọ na-ahụ n’abalị, ma lee, onye yiri nwa nke mmadụ+ nọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe. E kwere ka ọ banye n’ebe Onye Ochie ahụ nọ.+ E wee kpọrọ ya bịa nso n’ihu Onye ahụ. 14 E nyere ya ọchịchị,+ mee ka a na-akwanyere ya ùgwù,+ nyekwa ya alaeze, ka ndị dị iche iche, ndị si ná mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi.+ Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị akwụsị akwụsị. A gaghịkwa ebibi alaeze ya ebibi.+
-
-
Matiu 6:9-13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
“‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị+ nsọ.+ 10 Ka Alaeze gị+ bịa. Ka uche gị+ meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.*+ 11 Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa.+ 12 Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ.+ 13 Ekwela ka a nwata anyị,*+ kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.’+
-