15 Onye ahụ nwụrụ anwụ wee bilie nọrọ ọdụ, malite ikwu okwu, Jizọs akpọnyezie ya nne ya.+16 Egwu wee jide ha niile, ha amalitekwa ito Chineke, na-asị: “Nnukwu onye amụma abịakwutela anyị.”+ Ha ana-asịkwa, “Chineke echetala ndị ya.”+
2 Ọ bịakwutere Jizọs n’abalị,+ sị ya: “Rabaị,*+ anyị ma na ị bụ onye ozizi Chineke zitere n’ihi na e nweghị onye ga-arụli ọrụ ebube ndị a+ ị na-arụ* ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.”+
22 “Ndị Izrel, nụrụnụ ihe a: Unu ma na ọ bụ Chineke zitere Jizọs onye Nazaret. Chineke sikwa n’aka ya rụọ ọrụ ebube ma mee ihe ndị dị ịtụnanya* unu ma gbasara ha.+