27 Ofufe* dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’anya Chineke Nna anyị bụ: mmadụ inyere ụmụ na-enweghị nne na nna+ na ụmụ nwaanyị isi mkpe+ na-ata ahụhụ aka,+ nakwa mmadụ ịhụ na ụwa a emebighị ya.+
17 Ma onye ọ bụla nke nwere akụ̀ nke ụwa a ma ya ahụ na e nwere ihe na-akpa nwanna ya, ma o kweghị emetere ya ebere,* olee otú ọ ga-esi ekwu na ya hụrụ Chineke n’anya?+