-
1 Ndị Kọrịnt 9:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 Ọ bụrụ na anyị akụọla ihe ndị si n’aka Chineke n’ime unu, ọ̀ bụ ihe ọjọọ ma anyị si n’aka unu nweta ihe ụfọdụ anyị ga-eji na-egbo mkpa anyị?+ 12 Ọ bụrụ na ndị ọzọ nwere ikike isi n’aka unu nweta ihe, ọ̀ bụ na anyị akaghị ha nwee ikike a? N’agbanyeghị na anyị nwere ikike a, o nweghị ihe ọ bụla anyị si n’aka unu nweta.+ Kama anyị na-edi ihe niile, ka anyị wee ghara isi ụzọ ọ bụla mee ka ozi ọma gbasara Kraịst ghara ịna-aga aga.+
-