Diuterọnọmi 32:43 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 43 Unu mba niile, soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ,+N’ihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya.+ Ọ ga-akwụ ndị iro ya ụgwọ ihe ha mere,+Kpuchiekwara ala ndị ya mmehie.”* 2 Ndị Eze 9:7 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 7 Gbuo ndị ezinụlọ Ehab onyenwe gị. Mụnwa bụ́ Jehova ga-esikwa otú ahụ bọọrọ ndị ohu m ọbọ ọbara ha, ma ndị amụma m ma ndị ohu m ndị ọzọ, ndị Jezibel gburu.+ Abụ Ọma 79:10 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 10 Gịnị mere mba dị iche iche ga-eji sị: “Olee ebe Chineke ha nọ?”+ Ka anyị hụ mgbe a ga-eme ka mba niile mara Na ị bọọla ọbọ maka ọbara ndị ohu gị e gburu egbu.*+ Mkpughe 18:20 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 20 “Unu ndị nọ n’eluigwe+ na unu ndị nsọ+ na ndịozi na ndị amụma, ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi ihe e mere ya, maka na Chineke amaala ya ikpe maka ihe ndị o mere unu!”+ Mkpughe 18:24 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 24 A hụkwara ọbara ndị amụma na nke ndị nsọ+ na nke ndị niile e gburu n’ụwa n’ime gị.”+
43 Unu mba niile, soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ,+N’ihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya.+ Ọ ga-akwụ ndị iro ya ụgwọ ihe ha mere,+Kpuchiekwara ala ndị ya mmehie.”*
7 Gbuo ndị ezinụlọ Ehab onyenwe gị. Mụnwa bụ́ Jehova ga-esikwa otú ahụ bọọrọ ndị ohu m ọbọ ọbara ha, ma ndị amụma m ma ndị ohu m ndị ọzọ, ndị Jezibel gburu.+
10 Gịnị mere mba dị iche iche ga-eji sị: “Olee ebe Chineke ha nọ?”+ Ka anyị hụ mgbe a ga-eme ka mba niile mara Na ị bọọla ọbọ maka ọbara ndị ohu gị e gburu egbu.*+
20 “Unu ndị nọ n’eluigwe+ na unu ndị nsọ+ na ndịozi na ndị amụma, ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi ihe e mere ya, maka na Chineke amaala ya ikpe maka ihe ndị o mere unu!”+