Jenesis
11 N’oge ahụ, ndị niile bi n’ụwa na-asụ otu asụsụ, e nweghịkwa ihe dị iche n’otú ha niile si ekwu okwu. 2 Mgbe ha nọ na-aga n’ebe ọwụwa anyanwụ, ha hụrụ otu ndagwurugwu n’ala Shaịna,+ ha wee biri n’ebe ahụ. 3 Ha gwaziri ibe ha, sị: “Bịanụ ka anyị kpụọ brik ma nụchaa ya n’ọkụ.” Ha wee jiri brik mere nkume, jirikwa bitumen* mere ụrọ. 4 Ha kwuru, sị: “Bịanụ ka anyị rụọrọ onwe anyị obodo na ụlọ elu nke elu ya ga-eru n’eluigwe, ka anyị meekwa ka aha anyị na-ewu ewu, ka anyị wee ghara ịgbasa n’ebe niile n’ụwa.”+
5 Jehova wee gaa ka ọ hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ nọ na-arụ. 6 Jehova kwuziri, sị: “Ndị a dị n’otu, ha na-asụkwa otu asụsụ.+ Legodị ihe ha malitere ime. E nweghị ihe ọ bụla ha bu n’obi ime ha na-enweghị ike ime. 7 Bịa ka anyị+ gaa ebe ahụ ghagbuo asụsụ ha ka ha ghara ịghọta asụsụ ibe ha.” 8 Jehova wee chụsaa ha n’ebe ahụ, ha agaa biri n’ebe dị iche iche n’ụwa.+ Ha kwụsịziri ịrụ obodo ahụ. 9 Ọ bụ ya mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel*+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka Jehova gwagburu asụsụ ndị niile bi n’ụwa. Jehova chụsara ha n’ebe ahụ, ha agaa biri n’ebe dị iche iche n’ụwa.
Shem dị otu narị afọ (100) mgbe ọ mụrụ Apakshad.+ Ọ mụrụ ya afọ abụọ Iju Mmiri ahụ gachara. 11 Mgbe Shem mụchara Apakshad, ọ nọrọ ndụ narị afọ ise (500). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.+
12 Apakshad nọrọ ndụ afọ iri atọ na ise, o wee mụọ Shila.+ 13 Mgbe Apakshad mụchara Shila, ọ nọrọ ndụ narị afọ anọ na atọ (403). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.
14 Shila nọrọ ndụ afọ iri atọ, o wee mụọ Iba.+ 15 Mgbe Shila mụchara Iba, ọ nọrọ ndụ narị afọ anọ na atọ (403). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.
16 Iba nọrọ ndụ afọ iri atọ na anọ, o wee mụọ Pileg.+ 17 Mgbe Iba mụchara Pileg, ọ nọrọ ndụ narị afọ anọ na iri atọ (430). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.
18 Pileg nọrọ ndụ afọ iri atọ, o wee mụọ Riu.+ 19 Mgbe Pileg mụchara Riu, ọ nọrọ ndụ narị afọ abụọ na itoolu (209). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.
20 Riu nọrọ ndụ afọ iri atọ na abụọ, o wee mụọ Sirọg. 21 Mgbe Riu mụchara Sirọg, ọ nọrọ ndụ narị afọ abụọ na asaa (207). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.
22 Sirọg nọrọ ndụ afọ iri atọ, o wee mụọ Nehọ. 23 Mgbe Sirọg mụchara Nehọ, ọ nọrọ ndụ narị afọ abụọ (200). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.
24 Nehọ nọrọ ndụ afọ iri abụọ na itoolu, o wee mụọ Tira.+ 25 Mgbe Nehọ mụchara Tira, ọ nọrọ ndụ otu narị afọ na iri na itoolu (119). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.
26 Tira nọrọ ndụ afọ iri asaa, o wee mụọ Ebram,+ Nehọ,+ na Heran.
27 Ihe a bụ akụkọ ndụ Tira.
Tira mụrụ Ebram, Nehọ, na Heran, Heran wee mụọ Lọt.+ 28 Mgbe Tira nna Heran ka nọ ndụ, Heran nwụrụ n’obodo ebe a mụrụ ya, ya bụ, n’obodo Ọọ+ nke ndị Kaldia.+ 29 Ebram lụrụ nwaanyị, Nehọ alụọkwa nwaanyị. Aha nwunye Ebram bụ Seraị,+ aha nwunye Nehọ abụrụ Milka,+ nwa Heran. Heran bụ nna Milka na Iska. 30 Seraị bụ nwaanyị aga.+ Ọ mụtaghị nwa.
31 Tira wee kpọrọ Ebram nwa ya na Lọt nwa nwa ya,+ bụ́ nwa Heran, kpọrọkwa Seraị nwunye nwa ya, bụ́ nwunye Ebram nwa ya. Ha wee soro ya si n’obodo Ọọ nke ndị Kaldia pụọ gawa Kenan.+ Mgbe e mechara, ha rutere Heran+ wee biri n’ebe ahụ. 32 Tira nọrọ ndụ narị afọ abụọ na ise (205). Tira wee nwụọ na Heran.