Abụ Ọma
Abụ iru uju* Devid bụrụ mgbe ọ na-agwa Jehova ihe Kush onye si n’ebo Benjamin kwuru.
7 Jehova Chineke m, ọ bụ gị ka m ji mere ebe mgbaba.+
Zọpụta m n’aka ndị niile na-akpagbu m, napụtakwa m.+
2 Ma ọ́ bụghị ya, ha ga-adọri m* otú ọdụm si adọri anụ,+
Ha ga-adọkpụrụ m pụọ n’enweghị onye ga-anapụta m.
3 Jehova Chineke m, ọ bụrụ na e nwere ihe ọjọọ m mere,
Ọ bụrụ na e nwere ihe na-adịghị mma m mere,
4 Ọ bụrụ na m mejọrọ onye na-emere m ihe ọma,+
Ma ọ bụ, ọ bụrụ na m bukọọrọ ihe onye iro m mgbe ọ na-enweghị ihe o mere,*
Ka ọ zọda m* n’ala
Wee mee ka a kpụọ ùgwù m n’ala. (Sila)
6 Jehova, biko, jiri iwe bilie.
Bilie lebara oké iwe ndị iro m na-ewesa m anya.+
Bilie ka i nyere m aka. Nye iwu ka e kpee ikpe ziri ezi.+
7 Ka mba dị iche iche gbaa gị gburugburu.
Ị ga-esikwa n’elu mesie ha ike.
8 Jehova ga-ekwu ihe o kpebiri ime ndị dị iche iche.+
Jehova, biko, mgbe ị na-ekpe m ikpe,
Cheta ezi omume m na-eme nakwa otú m si akwụwa aka ọtọ.+
9 Biko, mee ka ihe ọjọọ ndị ajọ omume na-eme kwụsị.
Ma, chebe onye ezi omume,+
Ebe ọ bụ na ị bụ Chineke ezi omume,+ onye na-enyocha obi+ na ihe dị n’ala ala obi.*+
10 Chineke bụ ọta m,+ Onye na-azọpụta ndị obi ha dị ọcha.+
11 Chineke bụ Onyeikpe nke na-ekpe ikpe ziri ezi.+
Chineke na-ama ndị ajọ omume ikpe kwa ụbọchị.
12 Ọ bụrụ na mmadụ ajụ ichegharị,+ Chineke na-amụ mma agha ya.+
Ọ na-ekwe ụta ya, kwadebekwa ya.+
13 Ọ na-akwadebe ngwá ọgụ ndị na-egbu mmadụ.
Ọ na-akwadebe akụ́ ya ndị na-ere ọkụ.+
14 Legodị onye na-akpa nkata ọjọọ.*
Ọ na-echepụta ihe ọjọọ, ihe sikwa ya n’ọnụ apụta bụ ụgha.+
16 Ọ ga-eji isi ya buru nsogbu ọ na-akpata.+
Arụrụala ọ na-arụ ga-ala ya n’isi.