Jenesis
12 Jehova wee sị Ebram: “Kwapụ n’obodo gị, hapụkwa ndị ikwu gị na ezinụlọ nna gị, kwaga n’obodo m ga-egosi gị.+ 2 M ga-eme ka ị bụrụ nnukwu mba. M ga-agọzi gị. M ga-eme ka aha gị na-ede ude, a ga-esikwa n’aka gị gọzie ndị mmadụ.+ 3 M ga-agọzi ndị na-agọzi gị. M ga-abụ onye na-akpọ gị iyi ọnụ,+ a ga-esikwa n’aka gị gọzie ezinụlọ niile dị n’ụwa.”+
4 Ebram wee gawa otú Jehova gwara ya, Lọt sokwa ya gawa. Ebram dị afọ iri asaa na ise mgbe ọ hapụrụ Heran.+ 5 Ebram kpọọrọ Seraị nwunye ya+ na Lọt nwa nwanne ya,+ buru akụ̀ niile ha kpatara,+ kpọrọkwa ndị* na-ejere ha ozi ha nwetara na Heran. Ha wee kwapụ gawa Kenan.+ Mgbe ha rutere na Kenan, 6 Ebram gagidere n’ala ahụ ruo n’ebe a na-akpọ Shikem,+ n’akụkụ nnukwu osisi ndị dị na More.+ N’oge ahụ, ndị Kenan bi n’ala ahụ. 7 Jehova wee pụta n’ihu Ebram, sị ya: “Ọ bụ ụmụ* gị+ ka m ga-enye ala a.”+ O wee rụọrọ Jehova, onye pụtara n’ihu ya, ebe ịchụàjà n’ebe ahụ. 8 Mgbe e mechara, o si n’ebe ahụ kwaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Betel+ ma maa ụlọikwuu n’ebe ahụ. Betel dị n’ebe ọdịda anyanwụ ebe ahụ ọ mara ụlọikwuu, E-aị+ adịrị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ rụụrụ Jehova ebe ịchụàjà+ n’ebe ahụ, malitekwa ịkpọku aha Jehova.+ 9 E mechaa, Ebram kwaliri gawa n’ebe chere ihu na Negeb.*+ Ọ nọ na-ama ụlọikwuu n’ebe dị iche iche ka ọ na-aga.
10 Ma ụnwụ dara na Kenan, Ebram wee gawa Ijipt ka ọ gaa bitụ* n’ebe ahụ+ maka na ụnwụ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ na Kenan.+ 11 Mgbe ọ chọrọ ịbanye n’Ijipt, ọ gwara Seraị nwunye ya, sị: “Biko, gee m ntị. Ama m na ị mara mma nwaanyị.+ 12 N’ihi ya, ndị Ijipt hụ gị, ha ga-asị, ‘Onye a bụ nwunye ya.’ Ha ga-egbu m ma hapụ gị ndụ. 13 Biko, kwuo na ị bụ nwanne m nwaanyị, ka ha wee kpaso m àgwà ọma n’ihi gị, ka ha ghara igbu m.”+
14 Ozugbo Ebram banyere Ijipt, ndị Ijipt hụrụ na nwaanyị ahụ mara ezigbo mma. 15 Ndị Fero mere ndị isi hụkwara ya, ha wee malite ịgwa Fero na ọ mara mma. Ihe a mere ka a kpọta nwaanyị ahụ n’ụlọ Fero. 16 Ọ kpasoro Ebram àgwà ọma n’ihi Seraị. O wee kpụnye Ebram atụrụ, ehi, oké jakị, nne jakị, na kamel, kpọnyekwa ya ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-eje ozi.+ 17 Jehova wee mee ka Fero na ndị ezinụlọ ya rịa ajọ ọrịa* n’ihi Seraị, nwunye Ebram.+ 18 Fero wee kpọọ Ebram, sị ya: “Gịnị bụ ihe a i mere m? Gịnị mere na ị gwaghị m na ọ bụ nwunye gị? 19 Gịnị mere i ji sị, ‘Ọ bụ nwanne m nwaanyị,’+ nke mere na ọ fọrọ obere ka m lụwa ya? Lekwa nwunye gị. Kpọrọ ya lawa!” 20 Fero nyeziri ụmụ nwoke na-ejere ya ozi iwu, ha wee duru Ebram na nwunye ya na ihe niile o nwere si n’ala ahụ pụọ.+