Job
2 Mgbe e mechara, ụmụ ezi Chineke*+ bịara ka ha guzo n’ihu Jehova+ n’ụbọchị ọzọ. Setan bịakwara ka o soro ha guzo n’ihu Jehova.+
2 Jehova wee sị Setan: “Olee ebe i si bịa?” Setan zara Jehova, sị: “M nọ na-akpagharị n’ụwa, na-agagharịkwa n’ime ya.”+ 3 Jehova wee sị Setan: “Ì leruola ohu m Job anya?* Ị̀ hụla na e nweghị onye dị ka ya n’ụwa? Ọ bụ onye ezi omume nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.*+ Ọ na-atụ egwu Chineke, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ. Ọ ka kwụsiri ike n’ebe m nọ+ n’agbanyeghị na ị na-agbalị ime ka m laa ya+ n’iyi* ọ bụ eziokwu na e nweghị ihe o mere.” 4 Ma Setan gwara Jehova, sị: “Mmadụ nọrọ n’ọnụ ọnwụ, ọ ga-enye* ihe niile o nwere ka ọ zọọ ndụ* ya. 5 Ma, ọ bụrụ na ị ga-amatị aka gị ugbu a mee ka ọ rịawa ọrịa,* ọ ga-ekwujọ gị n’ihu gị.”+
6 Jehova sịziri Setan: “Lee, ọ nọ gị n’aka. Ma, egbula ya egbu.” 7 Setan wee si n’ihu Jehova pụọ ma mee ka etuto na-afụ ụfụ too Job,*+ malite n’ọbụ ụkwụ ya ruo n’opu isi ya. 8 Job wee were mpekere ite ụrọ kụwara akụwa na-akọ onwe ya ọkọ, ọ nọdụkwara ala ná ntụ.+
9 N’ikpeazụ, nwunye ya sịrị ya: “Ị̀ ka jisiri Chineke aka ike? Kpọọ Chineke iyi nwụọ.” 10 Ma ọ sịrị nwunye ya: “Ị na-ekwu okwu ka nwaanyị nzuzu. Ọ̀ bụ naanị ihe ọma ka anyị ga na-anata ezi Chineke, ghara ịnata ihe ọjọọ?”+ N’ihe a niile, Job ekwughị ihe ọjọọ ọ bụla.+
11 Ndị enyi Job atọ nụrụ ihe ọjọọ niile mere ya. Onye ọ bụla n’ime ha wee si n’obodo ya bịa. Aha ha bụ Elifaz+ onye Timan, Bildad+ onye Shua,+ na Zofa+ onye Neama.* Ha kwuru ka ha zukọta soro gaa sị Job ndo ma kasie ya obi. 12 Mgbe ha nọ n’ebe dị anya hụ ya, ha amataghị na ọ bụ ya. Ha bewere ákwá mgbe ha matara na ọ bụ ya, na-ebesi ya ike. Ha dọwara uwe ha, kpolie uzuzu elu, wụsakwa ya n’isi ha.+ 13 Ha sooro ya nọrọ ọdụ n’ala ruo ụbọchị asaa, ehihie na abalị. E nweghị onye gwara ya ihe ọ bụla n’ihi na ha hụrụ na ahụ́ na-egbusi ya mgbu ike.+