Job
22 Elifaz+ onye Timan kwuru, sị:
2 “È nwere uru mmadụ ga-abara Chineke?
È nwere uru onye nwere nghọta ga-abara ya?+
3 Ọ̀ gbasara Onye Pụrụ Ime Ihe Niile* na ị bụ onye ezi omume?
Ka è nwere uru ọ na-erite na ị bụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta?*+
4 Ọ̀ ga-ata gị ahụhụ
Ma kpọọ gị ikpe maka na ị na-asọpụrụ ya?
6 N’ihi na ị na-anara ụmụnne gị ihe ibé n’ihe ị na-ekwesịghị ịnara ihe ibé,
11 Ọ bụ ya mere ọchịchịrị ji gbachie nke na ị naghị ahụ ụzọ,
Idei mmiri ekpuchiekwa gị.
12 Ọ̀ bụ na Chineke anọghị n’ebe kacha elu n’eluigwe?
Lee, kpakpando niile dịkwa ezigbo elu.
13 Ma ị sịrị: ‘Gịnịdị ka Chineke ma?
Urukpuru ọ̀ ga-ekwe ya hụ ụzọ kpee ikpe?
14 Ígwé ojii na-anọchi ya nke mere na ọ naghị ahụ ụzọ
Ka ọ na-agagharị gburugburu eluigwe.’
Otú idei mmiri* si ebupụ ntọala ụlọ?+
17 Ha nọ na-asị ezi Chineke: ‘Hapụ anyị aka!’
Na-asịkwa, ‘Gịnị ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-eme anyị?’
18 Ma, ọ bụ ya mere ka ihe ndị dị mma ju n’ụlọ ha.
(Anaghị m eche ụdị ihe ọjọọ a n’obi m.)
19 Onye ezi omume ga-ahụ ihe a ṅụrịa ọṅụ.
Onye aka ya dị ọcha ga-akwa ha emo, sị:
20 ‘E bibiela ndị iro anyị,
Ọkụ ga-erechapụkwa ihe fọrọ na ha.’
21 Mata onye Chineke bụ, gị na ya ga-adị ná mma.
Ihe ọma ga-eruzi gị aka.
23 Ọ bụrụ na ị lọghachikwuru Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ihe ga-adịghachiri gị ná mma.+
Ọ bụrụ na i wepụ ajọ omume n’ụlọikwuu gị,
24 Ọ bụrụ na ị ga-atụnye ọlaedo gị n’ájá,
Tụbakwa ọlaedo kacha mma*+ ná nnukwu nkume ndị dị na ndagwurugwu,
25 Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-abụziri gị ọlaedo,
Ọ ga-abụkwara gị ọlaọcha kacha mma.
26 Ị ga na-enwezi obi ụtọ maka na gị na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile dị ná mma,
Ị ga-ewelikwa ihu gị lee Chineke.
27 Ị ga-arịọsi ya arịrịọ ike. Ọ ga-anụ olu gị.
Ị ga-emezukwa nkwa i kwere.
28 Ihe ọ bụla i kpebiri ime ga-aga nke ọma,
Ìhè ga na-enwukwa n’ụzọ gị.
29 N’ihi na a ga-eweda gị ala ma i kwuo okwu na-egosi na ị dị mpako.
Ma ọ ga-azọpụta onye dị umeala n’obi.
30 Ọ ga-anapụta ndị na-enweghị ihe ha mere.
N’ihi ya, ọ bụrụ na aka gị dị ọcha, ọ ga-anapụta gị.”