Ozi Ọma Luk Dere
19 Jizọs banyere Jeriko, na-achọ isi na ya gaa ebe ọzọ. 2 N’ebe ahụ, e nwere otu nwoke aha ya bụ Zakịọs. Ọ bụ onyeisi ndị ọnaụtụ. Ọ bakwara ọgaranya. 3 Ọ nọ na-achọ ịhụ Jizọs, ma o nweghị ike ịhụ ya n’ihi na ndị mmadụ karịrị akarị, yanwa dịkwanụ mkpụmkpụ. 4 N’ihi ya, ọ gbaara gaa n’ihu ihu ma rịgoro n’osisi sịkamọ* ka ọ hụ ya, maka na ọ ga-esi n’ụzọ ahụ agafe. 5 Mgbe Jizọs rutere ebe ahụ, o lere anya n’elu, sị ya: “Zakịọs, rịdata ọsọ ọsọ, n’ihi na m ga-abịa n’ụlọ gị taa.” 6 O wee rịdata ozugbo ma jiri obi ụtọ nabata ya n’ụlọ ya. 7 Mgbe ndị mmadụ hụrụ ihe a, ha niile malitere ịtamu ntamu, sị: “Leenụ, ọ gara nọrọ n’ụlọ nwoke bụ́ onye mmehie.”+ 8 Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, sị: “Onyenwe anyị, m ga-enye ndị ogbenye ọkara ihe m nwere. Ihe ọ bụla m pụnaara onye ọ bụla,* m ga-enyeghachi ya okpukpu anọ.”+ 9 Mgbe o kwuru ihe a, Jizọs sịrị ya: “Chineke azọpụtala gị na ezinụlọ gị taa, n’ihi na ị bụkwa nwa Ebreham. 10 N’ihi na Nwa nke mmadụ bịara ịchọ ndị furu efu na ịzọpụta ha.”+
11 Ka ha nọ na-ege ntị n’ihe ndị a, o meere ha ihe atụ ọzọ, n’ihi na ọ nọ nso na Jeruselem. Ha nọkwa na-eche na Alaeze Chineke na-aga ịbịa ozugbo.+ 12 O wee sị: “Otu nwoke bụ́ nwa eze gara n’ala dị anya+ ka e chie ya eze. Ọ lọta ya abụrụ eze. 13 Ọ kpọrọ mmadụ iri n’ime ndị ohu ya, nye ha maịna* iri, sị ha, ‘Zụwanụ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’+ 14 Ma ndị obodo ha kpọrọ ya asị. Ha wee zie ndị ozi ka ha gaa sị ya: ‘Anyị achọghị ka ị bụrụ eze anyị.’
15 “Mgbe e chichara ya eze ya alọta, ọ kpọrọ ndị ohu ahụ o nyere ego* ka ọ mata uru ha ritere n’ahịa ha zụrụ.+ 16 Onye mbụ bịara, sị ya, ‘Onyenwe m, eji m otu maịna i nyere m rite maịna iri ọzọ n’uru.’+ 17 Ya asị ya, ‘Ezigbo ohu, i mere nke ọma. Chịwa obodo iri, n’ihi na i gosila na i kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe dị nnọọ nta.’+ 18 Onye nke abụọ bịara, sị ya, ‘Onyenwe m, eji m otu maịna i nyere m rite maịna ise ọzọ n’uru.’+ 19 Ọ gwakwara onye nke a, sị, ‘Gịnwa, chịwa obodo ise.’ 20 Ma onye ọzọ bịara, sị ya, ‘Onyenwe m, lee maịna gị. M kechiri ya n’ákwà dewere gị. 21 Ị manụ na ị bụ onye aka ike. Egwu gị na-atụ m n’ihi na ị na-ewere ihe ị na-edebeghị, ị na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’+ 22 O wee sị ya, ‘Ajọ ohu, eji m ihe i kwuru na-ekpe gị ikpe. Ị̀ na-ekwu na ị ma na m bụ onye aka ike, na m na-ewere ihe m na-edebeghị, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị?+ 23 Gịnịzi mere na i tinyeghị ego m* n’ụlọ akụ̀? Mgbe m lọtara, m gaara anara ya na ọmụrụ nwa ya.’
24 “Ọ gwaziri ndị guzo n’akụkụ, sị, ‘Natanụ ya maịna ahụ nye onye ahụ nke nwere maịna iri.’+ 25 Ma ha sịrị ya, ‘Onyenwe anyị, o nwekwaranụ maịna iri.’— 26 ‘Ana m asị unu, onye ọ bụla nke nwere ihe, a ga-enyekwu ya. Ma onye na-enweghị, a ga-anapụdị ya nke o nwere enwe.+ 27 Kpọtanụ ndị iro m ndị a na-achọghị ka m bụrụ eze ha, gbuo ha n’ihu m.’”
28 Mgbe o kwuchara ihe ndị a, ọ gbagowere Jeruselem. 29 Mgbe o ruru Betfeji na Betani nso n’ugwu a na-akpọ Ugwu Oliv,+ ọ gwara mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya,+ sị: 30 “Gaanụ n’obodo a unu na-ahụ. Mgbe unu banyere n’ime ya, unu ga-ahụ nwa jakị e liwere eliwe, nke mmadụ ọ bụla na-anọtụbeghị n’elu ya. Tọpụnụ ya, kpụtakwanụ ya ebe a. 31 Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ unu, sị, ‘Gịnị mere unu ji na-atọpụ ya?’ sịnụ ya, ‘Onyenwe anyị chọrọ ka anyị kpụta ya.’” 32 Mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya gara hụ ya otú ahụ ọ gwara ha.+ 33 Ma ka ha nọ na-atọpụ nwa jakị ahụ, ndị nwe ya sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-atọpụ nwa jakị ahụ?” 34 Ha asị: “Onyenwe anyị chọrọ ka anyị kpụta ya.” 35 Ha wee kpụgara ya Jizọs. Ha wụkwasịkwara uwe elu ha n’elu nwa jakị ahụ, Jizọs anọrọ n’elu ya.+
36 Ka ọ na-aga, ha ana-agbasa uwe elu ha n’okporo ụzọ.+ 37 Ozugbo o rutere nso n’okporo ụzọ e si aga Ugwu Oliv, ìgwè mmadụ niile na-eso ụzọ ya malitere iji oké olu na-aṅụrị ọṅụ ma na-eto Chineke maka ọrụ ebube niile ha hụrụ, 38 sị: “Onye ahụ nke na-abịa dị ka Eze n’aha Jehova* bụ onye a gọziri agọzi! Ka udo dịrị n’eluigwe, ka e tookwa Chineke onye nọ ebe kacha elu!”+ 39 Ma, ụfọdụ n’ime ndị Farisii so n’ìgwè mmadụ ahụ sịrị ya: “Onye Ozizi, baara ndị na-eso ụzọ gị mba.”+ 40 Ma ọ sịrị: “Ana m asị unu, ọ bụrụ na ndị a agbachi nkịtị, nkume ga-eti mkpu.”
41 Mgbe o rutere Jeruselem nso, o lere ya anya ma beere ya ákwá,+ 42 sị: “Ọ gaara adị mma ma a sị na ị ghọtara n’ụbọchị taa ihe ndị ga-eme ka e nwee udo. Ma ugbu a, e zochiela ha ka anya gị ghara ịhụ ha.+ 43 N’ihi na ụbọchị na-abịa mgbe ndị iro gị ga-eji osisi pịrị ọnụ gbaa ogige gburugburu gị. Ha ga-agbakwa gị gburugburu ma si n’akụkụ niile na-enye gị nsogbu.+ 44 Ha ga-akụtu gị na ụmụ gị n’ala.+ Ha agaghịkwa ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya n’ime gị,+ n’ihi na ị ghọtaghị oge Chineke bịara kpee gị ikpe.”*
45 O wee banye n’ụlọ nsọ ma malite ịchụpụ ndị na-ere ihe,+ 46 sị ha: “E dere, sị, ‘Ụlọ m ga-abụkwa ụlọ ekpere,’+ ma unu emeela ya ọgba ndị ohi.”+
47 Ọ nọgidekwara na-ezi ihe kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ. Ma ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị isi ndị Juu nọ na-achọ igbu ya.+ 48 Ma ha amaghị otú ha ga-esi eme ya, n’ihi na mmadụ niile nọ na-esogharị ya ka ha nụ okwu ya.+