Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom
10 Ụmụnna m, ihe ọma m buuru ha n’obi na arịrịọ m na-arịọsi Chineke ike bụ ka a zọpụta ha.+ 2 N’ihi na m na-agba akaebe na ọ na-anụ ha ọkụ n’obi ijere Chineke ozi,+ ma ha amaghị Chineke nke ọma. 3 N’ihi na ebe ọ bụ na ha amaghị ihe bụ́ ezi omume n’anya Chineke,+ kama ha nọ na-achọ iji aka ha egosi na ha bụ ndị ezi omume,+ ha emeghị ihe bụ́ ezi omume n’anya Chineke.+ 4 N’ihi na Iwu ahụ* kwụsịrị na Kraịst,+ ka e wee kpọọ onye ọ bụla nwere okwukwe na ya onye ezi omume.+
5 N’ihi na Mosis dere banyere ihe Iwu ahụ kwuru bụ́ ezi omume, sị: “Onye na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ maka na ọ na-eme ha.”+ 6 Ma Akwụkwọ Nsọ gosiri na ọ bụ inwe okwukwe na-eme ka a kpọọ mmadụ onye ezi omume. Ọ sịrị: “Asịla n’obi gị,+ ‘Ònye ga-arịgo n’eluigwe?’+ ya bụ, ịga kpọdata Kraịst, 7 ma ọ bụ, ‘Ònye ga-arịda n’abis?’*+ ya bụ, ịga kpọlite Kraịst n’ọnwụ.” 8 Ma gịnị ka o kwuru? Ọ sịrị: “Okwu ahụ dị gị nso, n’ọnụ gị nakwa n’obi gị”;+ ya bụ, “okwu” anyị na-ekwusa nke e ji okwukwe ekweta. 9 N’ihi na ọ bụrụ na i ji ọnụ gị ekwusa n’ihu ọha na Jizọs bụ Onyenwe anyị+ ma nwee okwukwe n’obi gị na Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ, a ga-azọpụta gị. 10 N’ihi na mmadụ inwe okwukwe n’obi ya ga-eme ka ọ bụrụ onye ezi omume, ma ọ ga-eji ọnụ kwupụta ihe o kweere* n’ihu ọha+ ka e wee zọpụta ya.
11 N’ihi na e dere n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “E nweghị onye nwere okwukwe na ya a ga-emechu ihu.”+ 12 N’ihi na e nweghị ihe dị iche n’onye Juu na onye Grik.+ Ọ bụ otu onye bụ Onyenwe mmadụ niile, onye na-enye ndị niile na-akpọku ya ihe n’ụba. 13 N’ihi na “a ga-azọpụta onye ọ bụla na-akpọku aha Jehova.”*+ 14 Ma, olee otú ha ga-esi kpọkuo ya ma ọ bụrụ na ha enwebeghị okwukwe na ya? Oleekwa otú ha ga-esi nwee okwukwe n’onye ha na-anụbeghị banyere ya? Oleekwa otú ha ga-esi anụ ma ọ bụrụ na e nweghị onye ga-ekwusara ha banyere ya? 15 Oleekwa otú ha ga-esi kwusaa ma ọ bụrụ na e zigaghị ha?+ Otú ahụ ka e dere ya, sị: “Ụkwụ ndị na-ezi ozi ọma nke ihe dị mma mara ezigbo mma.”+
16 Ma, ọ bụghị ha niile nabatara ozi ọma* ahụ. N’ihi na Aịzaya sịrị: “Jehova,* ònye nwere okwukwe n’ihe a nụrụ n’ọnụ anyị?”*+ 17 N’ihi ya, ọ bụ ihe mmadụ nụrụ na-eme ka o nwee okwukwe.+ A na-anụkwa okwu ahụ ma mmadụ kwusaa banyere Kraịst. 18 Ma ana m ajụ, sị, Ọ̀ bụ na ha anụghị? N’eziokwu, “ụda ha ruru ụwa niile, ozi ha rukwara n’ebe niile mmadụ bi n’ụwa.”+ 19 Ma ana m ajụ, sị, Ọ̀ bụ na Izrel amaghị?+ Mosis bu ụzọ sị: “M ga-eji ndị mba ọzọ mee ka obi jọọ unu njọ. M ga-eji mba dị nzuzu kpasuo unu ezigbo iwe.”+ 20 Ma Aịzaya ji nnọọ obi ike kwuo, sị: “Ndị na-anaghị achọ m chọtara m;+ ndị na-anaghị ajụ ajụjụ m matara m.”+ 21 Ma o kwuru banyere Izrel, sị: “Ana m agbasara ndị na-enupụ isi na ndị na-agba isi akwara aka m mgbe niile.”+