Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Taịtọs 1:1-3:15
  • Taịtọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Taịtọs
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Taịtọs

AKWỤKWỌ OZI E DEGAARA TAỊTỌS

1 Abụ m Pọl, ohu Chineke na onyeozi Jizọs Kraịst. Okwukwe m nwere na ozi m na-eje dabara n’ụdị okwukwe ndị Chineke họọrọ nwere, dabakwa n’ihe anyị ma nke ọma bụ́ eziokwu. Eziokwu a dabakwara n’ihe bụ́ ife Chineke otú ọ chọrọ. 2 Ihe ndị a hiwere isi n’olileanya ịdị ndụ ebighị ebi,+ nke Chineke, onye na-enweghị ike ịgha ụgha,+ kwere nkwa ya mgbe dị anya gara aga. 3 Ma mgbe oge ya ruru, o si n’ozi ọma ọ họpụtara m ka m zisaa+ nke dabara n’iwu Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mee ka a mata okwu ya. 4 Taịtọs, ezigbo nwa nke anyị na ya nwere otu okwukwe, m na-edetara gị akwụkwọ ozi:

Ka Chineke Nna na Kraịst Jizọs Onye Nzọpụta anyị meere gị amara, meekwa ka udo dịrị gị.

5 M hapụrụ gị na Krit ka i dozie ihe ndị e kwesịrị idozi edozi* nakwa ka ị họpụta ndị okenye n’obodo dị iche iche, otú m gwara gị: 6 okenye ọgbakọ kwesịrị ịbụ onye a na-anaghị ebo ebubo, di otu nwaanyị, onye nwere ụmụ kwere ekwe ndị a na-anaghị ekwu na ha na-ebi ndụ ọjọọ ma ọ bụ na-eme isi ike.+ 7 Ebe ọ bụ na onye nlekọta bụ onye na-ejere Chineke ozi, o kwesịghị ịbụ onye a na-ebo ebubo, ekwe ekwe,+ onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye aṅụrụma, onye na-eti mmadụ ihe, onye ji anyaukwu achọ ihe ga-abara naanị ya uru, 8 kama o kwesịrị ịbụ onye na-ele ọbịa,+ onye hụrụ ihe ọma n’anya, onye na-ele ihe anya otú dị mma,+ onye ezi omume, onye jisiri Chineke aka ike,+ onye na-ejide onwe ya,+ 9 onye si n’otú o si akụzi ihe egosi na o jidesiri okwu nke eziokwu* aka ike,+ ka o nwee ike iji ihe dị mma* ọ na-akụzi na-agba ndị mmadụ ume,+ na-adọkwa ndị na-ekwugide nkụzi dị mma aka ná ntị.+

10 N’ihi na e nwere ọtụtụ ndị nnupụisi, ndị na-ekwu ihe na-abaghị uru, na ndị na-aghọgbu ndị mmadụ, karịchaa, ndị na-esi ọnwụ na mmadụ ga-ebirịrị úgwù.+ 11 E kwesịrị imechi ndị a ọnụ n’ihi na ha ji ihe ndị ha na-ekwesịghị ịkụzi na-emebi okwukwe ndị niile nọ n’ezinụlọ dị iche iche ka ha wee rite uru aghụghọ. 12 Otu onye n’ime ha, bụ́ onye amụma ha, sịrị: “Ndị Krit na-agha ụgha mgbe niile. Ha bụ ajọ anụ ọhịa. Ha bụ ndị na-eri oké nri n’enweghị ihe ha na-arụ.”

13 Àmà a bụ eziokwu. N’ihi ya, na-adọsi ha aka ná ntị ike ka ha kwụsie ike n’okwukwe, 14 ka ha ghara ịna-ege ntị n’akụkọ ifo ndị Juu, gharakwa ịna-ege ntị n’ihe ndị hapụrụ eziokwu nyere n’iwu. 15 Ihe niile dị ọcha n’ebe ndị dị ọcha nọ.+ Ma e nweghị ihe dị ọcha n’ebe ndị rụrụ arụ na ndị na-enweghị okwukwe nọ, kama uche ha na akọnuche ha rụrụ arụ.+ 16 Ha na-ekwu n’ihu ọha na ha ma Chineke, ma ọrụ ha na-arụ na-egosi na ha agọnahụla ya,+ n’ihi na ha bụ ndị e kwesịrị ịsọ oyi, bụrụkwa ndị nnupụisi na ndị na-erughị eru ịrụ ọrụ ọma ọ bụla.

2 Ma gịnwa, nọgide na-akụzi ihe dabara n’ozizi dị mma.*+ 2 Ka ndị agadi nwoke na-emeru ihe n’ókè, na-eji ihe akpọrọ ihe, na-ele ihe anya otú dị mma, nwee okwukwe siri ike, na-ahụ ndị ọzọ n’anya, na-atachi obi. 3 Ka ndị agadi nwaanyị na-akpa àgwà gosiri na ha na-asọpụrụ Chineke, ghara ịna-ekwutọ ndị ọzọ, ghara ịna-aṅụ oké mmanya, ka ha na-akụzi ihe dị mma, 4 ka ha wee na-adụ ụmụ nwaanyị na-akatabeghị ahụ́ ọdụ* ka ha hụ di ha n’anya, ka ha hụ ụmụ ha n’anya, 5 ka ha na-ele ihe anya otú dị mma, dị ọcha, na-arụ ọrụ n’ụlọ,* bụrụ ndị ezigbo mmadụ, ndị na-erubere di ha isi,+ ka a ghara ịkatọ okwu Chineke.

6 Na-adụkwa ụmụ okorobịa ọdụ ka ha na-ele ihe anya otú dị mma.+ 7 N’ihe niile, na-arụ ọrụ dị mma otú ndị ọzọ ga na-esi n’aka gị amụta ihe. Na-akụzi ihe bụ́ eziokwu* otú na-egosi na i ji ihe kpọrọ ihe,+ 8 na-ekwu okwu dị mma* nke a na-enweghị ike ịkatọ akatọ,+ ka ihere wee mee ndị na-emegide anyị, ebe ọ bụ na e nweghị ihe ọjọọ ha ga-ekwu banyere anyị.+ 9 Ka ndị ohu na-erubere ndị nwe ha isi n’ihe niile,+ na-agbalị ka ha na-eme ihe dị ndị nwe ha mma, ghara ịna-asa ha okwu, 10 ghara ịna-ezu ha ohi.+ Kama ka ha na-egosi na ha bụ ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi n’ihe niile, ka ha wee na-achọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe niile.+

11 N’ihi na e meela ka amara Chineke pụta ìhè, nke na-eme ka a zọpụta ụdị mmadụ niile.+ 12 Amara a na-akụziri anyị ka anyị ghara ịna-akpa àgwà na-adịghị Chineke mma, gharakwa ikwe ka ihe ọjọọ ndị dị n’ụwa na-agụ anyị agụụ.+ Ọ na-akụzikwara anyị ka anyị na-ebi ndụ otú gosiri na anyị na-ele ihe anya otú dị mma, na-eme ezi omume ma na-efe Chineke otú ọ chọrọ n’oge a.*+ 13 Ka ọ dị ugbu a, anyị na-eche ka ihe na-eme obi ụtọ anyị na-atụ anya ya mezuo,+ na-echekwa mgbe Chineke ukwu na Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-eme ka ebube ha pụta ìhè. 14 Kraịst nyere ndụ ya n’ihi anyị+ ka ọ tọhapụ anyị*+ ka anyị ghara ịna-eme ụdị ihe ọ bụla bụ́ imebi iwu nakwa ka ọ sachaara onwe ya ndị pụrụ iche bụ́ ndị nke ya, ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ dị mma.+

15 Na-akụzi ihe ndị a, na-adụkwa ndị ọzọ ọdụ* ma na-adọ ha aka ná ntị ebe ọ bụ na i nwere ikike zuru ezu ime ihe ndị a.+ Ekwela ka onye ọ bụla leda gị anya.

3 Na-echetara ha ka ha na-edo onwe ha n’okpuru ndị ọchịchị na ndị nọ n’isi ma na-erubere ha isi,+ ka ha dị njikere ịrụ ọrụ ọma ọ bụla, 2 ka ha ghara ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla, ghara ịbụ ndị okwu na ụka, kama ka ha na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị,+ jiri obi nwayọọ na-emeso mmadụ niile ihe mgbe niile.+ 3 N’ihi na anyịnwa nwere mgbe anyị bụ ndị na-amaghị ihe, ndị na-enupụ isi, ndị e duhiere eduhie, ndị na-agbara ihe dị iche iche na-agụ anyị agụụ na ikpori ndụ ohu, ndị na-eme ihe ọjọọ na ndị na-enwere ndị ọzọ anyaụfụ, ndị omume ha jọgburu onwe ya, ndị kpọrọ ibe ha asị.

4 Ma, mgbe e mere ka obiọma Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke,+ na ịhụnanya ọ hụrụ ụmụ mmadụ pụta ìhè 5 (ọ bụghị maka ọrụ ezi omume ọ bụla anyị rụrụ,+ kama ọ bụ n’ihi ebere ya),+ o si n’ahụ́ ọ sara anyị nke mere ka anyị dị ndụ+ nakwa mmụọ nsọ o ji mee ka anyị dị ọhụrụ zọpụta anyị.+ 6 O si n’aka Jizọs Kraịst Onye Nzọpụta anyị wụkwasị anyị mmụọ nsọ a n’ụba,+ 7 ka ọ ga-abụ mgbe a kpọrọ anyị ndị ezi omume n’ihi amara onye ahụ,+ anyị ga-eketa+ ndụ ebighị ebi anyị na-atụ anya ya.+

8 E kwesịrị ịtụkwasị okwu niile a obi, achọkwara m ka ị na-ekwusi okwu ha ike, ka ndị kweere na Chineke wee na-elekwasị anya n’ịrụ ọrụ dị mma mgbe niile. Ihe ndị a dị mma, ha bakwaara ndị mmadụ uru.

9 Ma zere arụmụka iberiibe na ịrụ ụka gbasara usoro ọmụmụ, zerekwa ise okwu na ịlụ ọgụ maka Iwu,* n’ihi na ha abaghị uru, ha bụkwa ihe efu.+ 10 Zere onye+ na-akwado inwe òtù+ ma ọ bụrụ na a dụọla ya ọdụ*+ nke mbụ na nke abụọ, 11 ebe ị ma na onye ahụ ahapụla ezigbo ụzọ ahụ ma na-eme mmehie, ọ maakwala onwe ya ikpe.

12 Mgbe m ga-ezitere gị Atemas ma ọ bụ Tikikọs,+ gbalịsie ike ka ị bịakwute m na Nikọpọlis, n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka m kpebiri ịnọ n’oge oyi. 13 Gbaa mbọ ka i nye Zinas, bụ́ onye ma Iwu,* nakwa Apọlọs ihe ndị dị ha mkpa, ka ihe ọ bụla ghara ịkọ ha na njem ha.+ 14 Ma, ka ụmụnna anyị mụtakwa ịna-arụ ọrụ dị mma ka ha nwee ike ịna-enyere ndị nọ n’ezigbo mkpa aka,+ ka ha wee na-arụpụta ihe dị mma.*+

15 Ndị niile mụ na ha nọ na-ekele gị. Keleere m ndị hụrụ anyị n’anya, ndị bụ́ ụmụnna anyị n’okwukwe.

Ka Chineke meere unu niile amara.

Ma ọ bụ “ihe ndị na-adịghị mma.”

Ma ọ bụ “ozi e kwesịrị ịtụkwasị obi.”

Ma ọ bụ “ihe bara uru.”

Ma ọ bụ “bara uru.”

Ma ọ bụ “na-echetara ha; na-azụ ha.”

Ma ọ bụ “na-elekọta ụlọ ha.”

O nwere ike ịbụ, “Jiri obi dị ọcha na-akụzi ihe.”

Ma ọ bụ “bara uru.”

Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”

Na Grik, “gbapụta anyị; napụta anyị.”

Ma ọ bụ “na-agbakwa ndị ọzọ ume.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ma ọ bụ “a dọchaa ya aka ná ntị.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Na Grik, “na-amị mkpụrụ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya