Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt 3 Jọn 1-14
  • 3 Jọn

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 3 Jọn
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
3 Jọn

JỌN NKE ATỌ

1 Gayọs, onye m hụrụ n’anya, onye m hụrụ n’anya n’eziokwu, mụnwa bụ́ okenye* na-edetara gị akwụkwọ ozi.

2 Onye m hụrụ n’anya, m na-ekpe ekpere ka ahụ́ na-agbasi gị ike nakwa ka ihe niile na-agara gị nke ọma, otú ha na-agara gị* nke ọma ugbu a. 3 N’ihi na m ṅụrịrị nnukwu ọṅụ mgbe ụmụnna bịara kwuo* na i jisiri eziokwu ahụ aka ike. M na-aṅụrịkwa ọṅụ na ị na-eje ije n’eziokwu ahụ.+ 4 E nweghị ihe na-eme m obi ụtọ karịa ihe a: na m ga-anụ na ụmụ m nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ.+

5 Onye m hụrụ n’anya, ihe ị na-emere ụmụnna, n’agbanyeghị na ị maghị ndị ha bụ,+ gosiri na i jisiri Chineke aka ike. 6 Ha akọọrọla ọgbakọ* banyere ịhụnanya gị. Biko, mgbe ha na-ala, gbalịa nyere ha aka otú ga-adị Chineke mma.+ 7 N’ihi na ọ bụ maka aha ya ka ha ji gawa izisa ozi ọma n’anaghị ndị mba ọzọ ihe ọ bụla.+ 8 N’ihi ya, anyị kwesịrị ịnabata ụdị ndị a nke ọma,+ ka anyị wee bụrụ ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ n’ịkwado eziokwu ahụ.+

9 E nwere akwụkwọ ozi m detaara ọgbakọ, ma Dayotrefis, onye na-achọ ịbụ onye mbụ n’ime ha,+ anaghị akwanyere ihe ọ bụla si n’aka anyị ùgwù.+ 10 N’ihi ya, ọ bụrụ na mụ abịa, m ga-eme ka a mata ọrụ ndị ọ na-arụ, na ọ na-akọsa ihe na-abụghị eziokwu* banyere anyị.+ Nke a ezughịrị ya. Ọ naghịdị anabata ụmụnna+ nke ọma. Ọ na-agbalịkwa igbochi ndị chọrọ ịnabata ha, na-achụpụkwa ha n’ọgbakọ.

11 Onye m hụrụ n’anya, esola ndị ọjọọ na-eme ihe ọjọọ, kama soro ndị na-eme ihe ọma mewe ihe ọma.+ Onye na-eme ihe ọma si na Chineke.+ Onye na-eme ihe ọjọọ ahụbeghị Chineke.+ 12 Ha niile kọrọ akụkọ ọma banyere Dimitriọs, eziokwu ahụ gbakwaara ya àmà. N’eziokwu, anyị na-ekwukwa okwu ọma banyere ya.* Ị makwa na ihe anyị na-ekwu* bụ eziokwu.

13 E nwere ọtụtụ ihe m chọrọ ịgwa gị, ma achọghị m iji mkpịsị akwụkwọ na ịnk na-edere gị ha. 14 Ma, enwere m olileanya na m ga-ahụ gị n’oge na-adịghị anya, anyị ga-ekwukwa okwu ihu na ihu.

Udo dịrị gị.+

Ndị enyi anyị na-ekele+ gị. Keleere m+ ndị enyi anyị n’otu n’otu.

Ma ọ bụ “agadi nwoke.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”

Na Grik, “gbaa àmà.”

Na Grik, “agbaarala ọgbakọ àmà.”

Na Grik, “na-ekwu okwu ọjọọ.”

Na Grik, “anyị na-agbakwara ya àmà.”

Na Grik, “àmà anyị na-agba.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya