Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w16 Septemba p. 22
  • Ime Ihe Jehova Kwuru Na-aba Uru Taa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ime Ihe Jehova Kwuru Na-aba Uru Taa
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • EZIGBO MKPEBI OTU NWANNA NWAANYỊ MERE NA POLAND
  • URU OZI ỌMA OTU NWAANYỊ ZIRI NA FIJI BARA
  • “Chineke Abụghị Onye Na-ele Mmadụ Anya n’Ihu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya
    Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • Ikpebisi Ike Ijere Jehova Ozi!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Mmadụ nke Chọtaworo Amamihe Bụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
w16 Septemba p. 22

Ime Ihe Jehova Kwuru Na-aba Uru Taa

EZIGBO MKPEBI OTU NWANNA NWAANYỊ MERE NA POLAND

“M MERE baptizim mgbe m dị afọ iri na ise. Mgbe ọnwa isii gara, m bidoro ịsụ ụzọ inyeaka. Mgbe otu afọ gakwara, m malitere ịsụ ụzọ oge niile. Mgbe m gụchara akwụkwọ sekọndrị, m tinyere akwụkwọ ka e ziga m n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. M chọrọ ịhapụ obodo anyị, hapụkwa nne nne m na-abụghị Onyeàmà Jehova mụ na ya bi kemgbe. O wutere m mgbe onye nlekọta sekit gwara m na ọ bụ obodo ahụ a mụrụ m ga-abụ ókèala m. M gbalịrị ka ọ ghara ịmata otú obi dị m. M kpudoro ihu n’ala pụwa ka m gaa chebara ihe ahụ ọ gwara m echiche. M gwara nwanna nwaanyị mụ na ya ga-eso na-arụ ebe ahụ, sị: ‘Ọ dị m ka m̀ na-eme ka Jona. Ma Jona mechara gaa Ninive. N’ihi ya, mụnwa ga-eje ozi n’ebe a gwara m.’

“Asụọla m ụzọ afọ anọ n’obodo anyị. Ahụkwala m uru ime ihe a gwara m bara. Ihe bụ́bu nsogbu m bụ na otú m si na-ele ebe m ga-eje ozi anya adịghị mma. Ma, obi na-adị m ezigbo ụtọ ugbu a. N’otu ọnwa, m mụụrụ mmadụ iri abụọ na anọ Baịbụl. Jehova nyeere m aka ịmalitere nne nne m na-anabughị eji anya ahụ Ndịàmà Jehova ọmụmụ Baịbụl.”

URU OZI ỌMA OTU NWAANYỊ ZIRI NA FIJI BARA

E nwere otu nwaanyị a na-amụrụ Baịbụl n’obodo Fiji. Otu ụbọchị, ọ dabara na ọ ga-ekpebi ma ọ̀ ga-aga mgbakọ ukwu Ndịàmà Jehova ka ọ̀ ga-eso di ya gaa ememme ụbọchị ọmụmụ onye ikwu ha. Di ya kwetara ka ọ gaa mgbakọ ahụ. Nwunye ya agwa ya na ya nwekwara ike ịbịa ememme ahụ ma a gbasaa mgbakọ ahụ. Ma, mgbe nwaanyị ahụ lọtara, o kpebiri na ya agaghị aga ememme ahụ n’ihi na obi ya gwara ya na ọ ka mma ka ọ ghara ịga ebe nwere ike ime ka o siere ya ike ime ihe Chineke chọrọ.

Di ya gwara ndị ikwu ha na ya gwara nwunye ya ka ọ bịa ma ha gbasaa “nzukọ Ndịàmà Jehova” ọ gara, ha asị ya, “Ọ gaghị abịa. Ndịàmà Jehova anaghị eme ememme ụbọchị ọmụmụ.”a

Obi tọrọ di ya ezigbo ụtọ na nwunye ya guzosiri ike n’ihe o kweere nakwa na o meghị ihe ga-eme ka akọnuche ya pịawa ya ụtarị. Ihe a o mere mere ka o nwee ike izi di ya na ndị ọzọ ozi ọma. Gịnị mechara mee? Di ya kwetara ka a mụwara ya Baịbụl, ya esorokwa nwunye ya na-aga ọmụmụ ihe.

a Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche December 15, 2001.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya