Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/96 p. 3
  • Jiri Nkwuwa Okwu Kpọsaa Ozi Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Nkwuwa Okwu Kpọsaa Ozi Ọma
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Nkwuwa Okwu Na-ekwusa Ozi Ọma Ka Jizọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ị̀ Na-eji Nkwuwa Okwu Eme Nkwusa?
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • ‘Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Nọgide Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu
    Ozi Alaeze Anyi—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 11/96 p. 3

Jiri Nkwuwa Okwu Kpọsaa Ozi Ọma

1 Na-adabere n’akụkọ ihe mere eme, a maara ezi ndị Kraịst maka nkwuwa okwu ha. Ndị ozi bụ́ Pita na Jọn bụ ihe nlereanya pụtara ìhè na nke a. N’agbanyeghị na a tụbara ha n’ụlọ mkpọrọ ma yie ha egwu, ndị ozi a ji atụghị egwu na nkwuwa okwu nọgide na-ekwu eziokwu. (Ọrụ 4:18-20, 23, 31b) Pọl jikwa nkwuwa okwu gaa n’ihu n’ozi ya n’ókèala siri ike ọ bụ ezie na a kpagburu ya nke ukwuu.—Ọrụ 20:20; 2 Kọr. 11:23, 28.

2 Olee otú o si bụrụ na n’agbanyeghị oké ihe isi ike, ndị ozi ahụ tinyere ndị Kraịst ndị ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nile nwere ike ịga n’ihu n’iji nkwuwa okwu na-akpọsa ozi ọma? Pọl onyeozi na-aza ajụjụ ahụ ná 1 Ndị Tesalọnaịka 2:2, ebe ọ na-asị: “Anyị kwuwara okwu n’ime Chineke anyị ịgwa unu ozi ọma Chineke.” N’ụzọ yiri nke ahụ, Pita na Jọn tinyere ndị ọzọ na-eso ụzọ nwere ike iji nkwuwa okwu kpọsaa ozi ọma. Mgbe a tọhapụsịrị ha n’ụlọ mkpọrọ ha, Pita na Jọn weghachiiri ndị na-eso ụzọ ibe ha akụkọ. N’ekpere, ha rịọrọ Jehova ka o nye ha obi ike na ume ‘iwere nkwuwa okwu na-ekwu okwu ya.’ Chineke zara ekpere a ozugbo mgbe ‘ha nile jupụtara na mmụọ nsọ, wee were nkwuwa okwu na-ekwu okwu Chineke.’—Ọrụ 4:29, 31.

3 Igosipụta Obi Ike n’Ebe Jehova Nọ: Ndị ozi ahụ nwere obi ike na Jehova na-akwado ha. Nkwa nile Jehova kwere site n’Okwu ya na-emezu. E sitekwara n’aka Jisọs Kraịst mee ka ndị a ga-emezu bụrụ ihe e ji n’aka. Ànyị nwere otu ụdị obi ike ahụ iji nkwuwa okwu na-akpọsa ozi ọma? Ọ bụ ezie na anyị adịghị ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche ma ọ bụ na-agwọ ndị ọrịa, ka o sina dị, anyị nwere ihe àmà buru ibu nke nkwado Jehova. Mgbe anyị na-ahụ mmezu nke amụma Bible, à na-akwali anyị iji nkwuwa okwu na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke?

4 Otú ọ dị, a ga-atụ anya na nkwuwa okwu dị otú ahụ ga-ezute mmegide. (Jọn 15:20) Nke ahụ bụ ihe mere n’ebe Jisọs na ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ. Ma nke a egbochighị ha ma ọ bụ belata ịnụ ọkụ n’obi nke ha ji mee nkwusa. N’ezie, ọtụtụ mgbe mmegide dị otú ahụ nyere ha ohere ka ukwuu ịgbasa ozi ọma Alaeze. (Ọrụ 4:3, 8-13a) N’ihi nrapara anyị bụ́ ndị Kraịst na-arapara n’Okwu Chineke n’ihe iseokwu ndị dị mkpa, a na-akpọ anyị òkù ọtụtụ mgbe ikwu ihe mere anyị ji nwee nguzo anyị. Anyị na-ewere oge ndị dị otú ahụ dị ka ohere iji nkwuwa okwu kpọsaa ozi ọma. Site n’ime otú ahụ, anyị na-eṅomi Jisọs Kraịst na ndị ozi ya.

5 Ịsụ ụzọ inyeaka na-enye anyị ohere ka ukwuu iji kpọsaa ozi ọma. Ọtụtụ ga-asụ ụzọ inyeaka na November. Ọnọdụ gị hà ga-enye gị ohere itinye akwụkwọ? Site n’ime mgbalị ikere òkè n’ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, anyị na-egosi na anyị onwe anyị dị ka Pọl na Banabas. Ọrụ 14:3 na-ekwu na ‘ha nọgidere n’ebe ahụ n’oge dị anya, na-ekwuwa okwu n’ime Onyenwe anyị.’ Ọ bụrụ na anyị ga-esite n’ihe omume ndị ọzọ zụchapụta oge iji tinye 60 hour ma ọ dịkarịa ala n’ozi ubi n’ime otu ọnwa, obi abụọ adịghị ya na ngọzi anyị ga-amụba.

6 Inwe nkwuwa okwu n’ozi na-enye aka karịsịa mgbe a na-enyefe magazin, ụtụ, na akwụkwọ ndị ọzọ nke ọchịchị Chineke. Ha nwere ozi na-azọpụta ndụ dabeere n’Okwu Chineke. Ya mere ka anyị ghara ịla azụ kama jiri nkwuwa okwu na-eme nkwusa n’iṅomi Onye Nlereanya anyị, bụ́ Jisọs, na ndị ozi ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya