“Nke A Bụ Ndụ Ebighị Ebi”
1 E kwesịrị iji okwu Jisọs e dekọrọ na Jọn 17:3 kpọrọ ihe. O jighị egwú kwuo ya—ịnara ihe ọmụma Chineke na Kraịst bụ ndụ ebighị ebi! Ma ọ̀ bụ nanị site n’anyị inwe ihe ọmụma Jehova na Jisọs ka a ga-eji jiri ndụ agwụghị agwụ kwụghachi anyị ụgwọ? Ee e. Ndị Israel maara na Jehova bụ Chineke ha, ma ụzọ ndụ ha egosipụtaghị nkweta ahụ. N’ihi ya, ha tụfuru ihu ọma ya. (Hos. 4:1, 2, 6) Taa ọtụtụ nde mmadụ pụrụ ịdị “na-anụ ọkụ n’obi n’ebe Chineke nọ, ma ọ bụghị dị ka mmazu si dị.” (Rom 10:2) Ọ dị ha mkpa ịmata Jehova, bụ́ “nanị ezi Chineke ahụ,” na ịmụta otú e si efe ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Iji mezuo nke ahụ, n’ọnwa November anyị ga-enyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Olee ụzọ ị ga-eji mee ihe n’iche akwụkwọ Ihe Ọmụma n’ihu mmadụ? Nke a bụ arọ ụfọdụ ndị pụrụ inyere gị aka.
2 Ebe ọ bụ na echiche nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala bụ ihe ọhụrụ nye ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ, okwu mmalite nke a pụrụ ịdọrọ mmasị ha:
◼ “Anyị na-ajụ ndị agbata obi anyị otu ajụjụ. Ọ bụrụ na a kpọrọ gị òkù ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa nke dị ka nke a, ị̀ ga-anakwere ịkpọ òkù ahụ? [Gosi ihe osise dị na peji nke 4-5 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Nye ohere maka nzaghachi.] Nke a pụrụ n’ezie ịbụ ahụmahụ obi ụtọ gị ná ndụ. Ma gịnị ka i chere ị na-aghaghị ime ka o wee ghọọ ihe bụ ezie nye gị? [Nye ohere maka nzaghachi.] Rịba ama ihe a chọrọ ka e mee dị ka Jọn 17:3 si kwuo. [Gụọ.] Akwụkwọ a na-enyere ọtụtụ ndị aka inweta ụdị ihe ọmụma a pụrụ iche. Ị pụrụ inweta nke a n’ụtụ ₦80. Mgbe ọzọ m ga-abịa, anyị pụrụ ịtụle ihe mere o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na anyị pụrụ inweta ndụ ebighị ebi kpọmkwem n’ebe a n’elu ala.”
3 Mgbe ị laghachiri ileta ndị gị na ha tụlere Jọn 17:3, ị pụrụ ịga n’ihu n’ụzọ nke a:
◼ “N’ọbịbịa m nke gara aga, agụụrụ m gị okwu Jisọs ndị na-akpali mmasị nke a na-achọta na Jọn 17:3, ebe o mesiri anyị obi ike na ịnara ihe ọmụma Chineke na nke ya bụ ndụ ebighị ebi. Ma ọtụtụ mmadụ kwere na a pụrụ inweta ndụ ka mma nanị n’eluigwe. Gịnị ka i chere banyere nke ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọ bụrụ na akwụkwọ ahụ ị natara dị nso, m ga-achọ igosi gị amaokwu ụfọdụ nke Bible ndị na-egosi na a ga-eweghachi Paradaịs n’elu ala. [Tụlee paragraf nke 11-16 na peji nke 9-10 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.] Mgbe ọzọ m ga-abịa, m ga-achọ igosi gị ihe mere ị pụrụ iji tụkwasị obi ná nkwa ndị a a na-achọta n’ime Bible. Ka ọ dị ugbu a, ikekwe ị pụrụ ịgụ isi nke 2 n’akwụkwọ nke gị.”
4 Nke a bụ ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ị pụrụ iji mee ihe n’ebe ndị ji okpukpe kpọrọ ihe nọ:
◼ “Anyị anọwo na-agwa ndị agbata obi anyị okwu banyere ihe mere e ji nwee ọtụtụ okpukpe dị iche iche n’ụwa. E nwere ihe karịrị òtù okpukpe 10,000 n’ụwa nile. Ma, e nwere nanị otu Bible. N’echiche nke gị, gịnị mere e ji nwee ọgba aghara a n’okpukpe? [Nye ohere maka nzaghachi. Sapeta akwụkwọ Ihe Ọmụma n’isi nke 5, ma gụpụta paragraf 1.] Ị ga-enweta azịza ndị na-eju afọ nye ajụjụ ndị ahụ site n’ịgụ isiakwụkwọ a. M ga-enwe obi ụtọ ịhapụrụ gị akwụkwọ a n’ụtụ ₦80 ma ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inyocha ya.” Ọ bụrụ na a naara ya, mee ndokwa doro anya ịlọghachi, ma kwuo, sị: “Mgbe m bịaghachiri, ikekwe anyị pụrụ ịtụle ma okpukpe nile hà bụ nanị ụzọ dị iche iche na-eduga n’otu ebe.”
5 Mgbe ị laghachiri iji gaa n’ihu ná nkwurịta okwu banyere ihe mere e ji nwee ọtụtụ okpukpe otú a, ị pụrụ ikwu nke a:
◼ “Na mgbe ikpeazụ mụ na gị kwurịtara okwu, ewelitere m ajụjụ bụ́ ma okpukpe nile hà bụ nanị ụzọ dị iche iche na-eduga n’otu ebe. Gịnị ka i chere banyere nke ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] M ga-achọ igosi gị n’akwụkwọ ahụ m hapụụrụ gị ihe Jisọs kwuru n’okwu ahụ. [Sapeta isi nke 5 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, gụpụtakwa paragraf nke 6-7, tinyere Matiu 7:21-23.] Ọ pụrụ iju gị anya ihe mere o ji dị oké mkpa ịmara kpọmkwem ihe bụ uche Chineke. Ị ga-achọpụta na paragraf ndị na-esonụ na-enye ihe ọmụma. Biko gụtọpụ isiakwụkwọ a. Mgbe ọzọ m bịara, m ga-enwe obi ụtọ igosi gị uru nke inwe ezi ihe ọmụma Bible.”
6 Ụzọ ịga n’ihe kpọmkwem na-enwekarị ihe ịga nke ọma n’ịmalite ọmụmụ Bible. Nke a bụ okwu mmalite a tụrụ arọ ya nke dị na peji nke 12 n’akwụkwọ “Reasoning”:
◼ “Abịara m ịgwa gị ka anyị nwee usoro ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Ọ bụrụ na ị chọọ, m ga-achọ iji nanị minit ole na ole gosi gị otú ndị mmadụ n’ihe dị ka ala 200 si atụle Bible n’ebe obibi dị ka ìgwè ezinụlọ. Anyị pụrụ iji nke ọ bụla n’isiokwu ndị a mee ihe dị ka ebe ndabere maka nkwurịta okwu. [Gosi ihe ndị dị n’ime akwụkwọ Ihe Ọmụma.] Olee nke masịrị gị karịsịa?” Chere ka onye ahụ mee nhọrọ. Sapeta isiakwụkwọ nke ọ họọrọ, ma malite ọmụmụ ihe ahụ na paragraf nke mbụ.
7 Nke a bụ ụzọ ịga n’ihe kpọmkwem ọzọ dị irè nke ị pụrụ ịnwale maka ịmalite ọmụmụ ihe:
◼ “Ana m enye ihe ọmụma Bible n’efu, enwekwara m ohere n’usoro ihe omume m maka inwekwu ndị mmụta. Ihe a na-enye aka ịmụ Bible bụ ihe anyị ji eme ihe. [Gosi akwụkwọ Ihe Ọmụma.] Usoro ọmụmụ ihe ahụ na-adịru nanị ọnwa ole na ole, na-enyekwa azịza maka ajụjụ ndị dị ka: N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị? N’ihi gịnị ka anyị ji aka nká, na-anwụkwa anwụ? Gịnị na-eme ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ? Na olee otú anyị pụrụ isi bịaruo Chineke nso?” Mgbe ahụ jụọ, sị, “M̀ pụrụ igosi gị otú e si amụ ya?” Ọ bụrụ na a jụrụ ọmụmụ ihe ahụ, nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma n’ụtụ a na-enyefe ya.
8 Lee akụ̀ dị oké ọnụ ahịa ezi ihe ọmụma Chineke na Kraịst bụ nye onye ọ bụla nwere ya! Ịnara ya bụ n’ezie ndụ ebighị ebi n’ọnọdụ ndị zuru okè. Ka anyị jiri ohere nile na November soro ndị ọzọ kerịta ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.