Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/96 p. 1
  • Ònye Ga-ege Ntị n’Ozi Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Ga-ege Ntị n’Ozi Anyị?
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Anyị Nwere Ngwá Ọrụ Ọhụrụ Maka Iji Na-amalite Ọmụmụ Ihe!
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Nweta Obi Ike Ime Nletaghachi
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • “Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Mkpọsa Gara Nke Ọma E Ji Akụkọ Alaeze Mee
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 12/96 p. 1

Ònye Ga-ege Ntị n’Ozi Anyị?

1 Dị ka a na-emetụbeghị n’akụkọ ihe mere eme mmadụ, e jiwo ihe ọmụma, nke ọtụtụ n’ime ha na-adịghị mkpa, ọbụna na-eduhie eduhie, kpuchigide ụmụ mmadụ. N’ihi nke ahụ, ike na-agwụ ọtụtụ ndị, ọ na-aghọkwara anyị ihe ịma aka ime ka ha gee ntị n’ozi banyere Alaeze Chineke. Ha adịghị aghọta mmetụta dị mma ha ige Okwu Chineke ntị pụrụ inwe n’ebe ha nọ.—Luk 11:28.

2 Anyị na-aṅụrị ọṅụ na n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, ọtụtụ iri puku ndị mmadụ na-ege ntị n’ozi ahụ, na-anakwerekwa ọmụmụ Bible ebe obibi anyị na-enye ha. Otú ọ dị, n’ókèala ndị ọzọ, nzaghachi adịchaghị ukwuu otú ahụ. Ọtụtụ nleta anyị na-eme n’ozi ahụ adịghị arụpụta ihe dị mma, ọ pụkwara ịgbagwoju anyị anya ma ọ̀ dị onye ga-ege ntị n’ozi anyị.

3 Anyị aghaghị iche nche megide ịghọ ndị dara mbà n’obi. Pọl kọwara, sị: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya. Hà ga-esikwa aṅaa kpọkuo Onye ahụ . . . ha a ka-anụghị okwu Ya? ma hà ga-esi aṅaa nụ ma onye na-ekwusa anọghị? . . . dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu, bụ́ ụkwụ ndị na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe!” (Rom 10:13-15) Ọ bụrụ na anyị ejiri ịdị uchu kụọ mkpụrụ Alaeze, Chineke ga-eme ka o too n’ime ndị nwere obi eziokwu.—1 Kọr. 3:6.

4 Ọgwụ Ya Bụ Ime Nletaghachi Mgbe Nile: N’ókèala ebe o yiri ka mmadụ ole na ole na-ege ntị n’ozi anyị, ọ dị anyị mkpa ilekwasị anya n’ịzụlite mmasị ọ bụla anyị chọtara, ma ànyị tinyere akwụkwọ ma ọ bụ na anyị etinyeghị. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji dị ngwa ikpebi na ọ dịghị ihe a ga-arụzu? Mgbe anyị kụrụ mkpụrụ, anyị adịghị ama ebe ọ ga-eme nke ọma. (Ekli. 11:6) Ọ bụrụ na anyị akwadebe ikerịta ihe sitere n’Akwụkwọ Nsọ mgbe anyị lọghachiri, ọbụna ọ bụrụ na ọ dị nnọọ nkenke, anyị pụrụ inwe ike irute n’obi onye ahụ. Anyị pụrụ ịhapụ traktị ma ọ bụ nyefee magazin ndị kasị ọhụrụ. Ka oge na-aga, anyị pụrụ inwe ike igosi otú e si enwe ọmụmụ Bible. Anyị ga-enwe ihe ijuanya n’ọṅụ nke ịhụ ókè Jehova na-agọzi mgbalị anyị.—Abụ Ọma 126:5, 6.

5 A hapụụrụ otu nwanyị gosiri mmasị otu traktị. A hụghị ya ọzọ n’ụlọ ruo ọnwa abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, mgbe ahụkwa o ji ọrụ n’aka nke ukwuu nke na ọ pụghị ikwu okwu. A hapụụrụ ya otu traktị ahụ ọzọ. N’agbanyeghị mgbalị onye nkwusa ahụ nọgidere na-eme inweta ya n’ụlọ, o were ọnwa atọ ọzọ iji nweta ya, nanị ịchọpụta na ọ na-arịa ọrịa. Nwanna nwanyị ahụ gaghachiri ọzọ n’izu na-esonụ, a malitekwara mkparịta ụka dị mkpirikpi banyere traktị ahụ. Mgbe nwanna nwanyị ahụ laghachiri n’izu sochirinụ, nwanyị ahụ gosiri ezi mmasị n’ozi Alaeze ahụ. Mgbanwe ọnọdụ e nwere ná ndụ ya mere ka ọ mata mkpa ime mmụọ ya. A malitere ọmụmụ Bible, o jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-amụ ihe kwa izu mgbe nke ahụ gasịrị.

6 Dị ka ọ dị n’ihe ọ bụla anyị chọrọ ịhụ ka ọ na-eto, ma ọ̀ bụ okooko osisi, akwụkwọ nri, ma ọ bụ mmasị n’ozi Alaeze ahụ, nzụlite dị mkpa. Nke ahụ na-ewe oge, oké mgbalị, omume nchebara echiche, na mkpebi siri ike ịghara ịkwụsị. N’afọ gara aga, e mere ihe karịrị otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke otu nde mmadụ baptism, bụ́ ndị mkpụrụ Alaeze ahụ gbanyeworo mkpọrọgwụ n’ime ha! Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme nkwusa, anyị ga-ejide n’aka ịchọta ọtụtụ ndị ọzọ ga-ege ntị n’ozi anyị.—Tụlee Ndị Galetia 6:9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya