Inye Onwe Anyị n’Afọ Ofufo
1 Ọbụ abụ bụ́ Devid buru amụma na ndị Jehova “bụ onyinye afọ ofufo,” ya bụ, dị ka “ndị ọrụ afọ ofufo dị njikere.” (Abụ Ọma 110:3, nkọwa ala ala peji NW) A na-emezu nke a n’ezie n’etiti òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ. Na nke ọ bụla n’ime afọ ije ozi anọ gara aga, ndị Jehova etinyewo ihe karịrị otu ijeri hour n’ịgbasa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Tụkwasị n’ọrụ ime nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ, e nwekwara ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi nye onwe anyị n’afọ ofufo iji nyere ndị ọzọ aka.
2 Ụzọ Ndị Anyị Pụrụ Isi Gosipụta Ịdị Njikere Anyị: Ụfọdụ n’ọgbakọ pụrụ inwe mkpa enyemaka ịga nzukọ. Gịnị ma i wepụta onwe gị ịkpọrọ ha mgbe ị na-aga? Ndị ọzọ pụrụ ịbụ ndị ọrịa, ndị ahụ na-adịkwaghị ike, ma ọ bụ nọrọ n’ụlọ ọgwụ. Ị̀ pụrụ ibute ụzọ n’ileta ha ma ọ bụ nye aka n’ụzọ ụfọdụ? A pụrụ inwe otu onye ma ọ bụ ezinụlọ agbamume dị mkpa. Ì chewo echiche ịkpọ ndị dị otú ahụ òkù isonye n’ọmụmụ ihe ezinụlọ gị site na mgbe ruo na mgbe? Onye ọsụ ụzọ ma ọ bụ onye nkwusa pụrụ inwe mkpa nke onye ibe n’ozi. Gịnị ma i wepụta onwe gị isoro ya rụkọọ ọrụ n’ozi? Ndị a bụ ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi wepụta onwe anyị n’afọ ofufo ịrụ ihe dị mma n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.—Gal. 6:10.
3 Ụmụnna nwoke pụrụ igosi ịdị njikere ha ka e jiri ha mee ihe ná nzukọ Jehova site n’ịgbalị iru ihe ndị a chọrọ maka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. (1 Tim. 3:2-10, 12, 13; Taị. 1:5-9) Ka anyị nọgidere na-eto n’ọnụ ọgụgụ, e nwere mkpa maka ụmụnna nwoke ruru eru, ndị dị njikere ibute ụzọ n’ime nkwusa na izi ihe na n’ịzụ ọgbakọ dị ka atụrụ.—1 Tim. 3:1.
4 Ikekwe ụfọdụ n’ime anyị pụrụ iwepụta onwe anyị maka ozi Jehova n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu site n’idebanye aha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka site na mgbe ruo na mgbe. Ọzọkwa, site n’ime mgbanwe ole na ole ezi uche dị n’ime ha n’usoro ihe omume anyị, anyị pụrụ inwe ike ime otú ahụ gaa n’ihu ma ọ bụ ọbụna were ozi ọsụ ụzọ oge nile. Ọnọdụ anyị hà bụ nke na anyị nwere ike ịkwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka enyemaka? Ànyị pụrụ iwepụta onwe anyị ịrụ ọrụ na Betel wee si otú a na-atụnye ụtụ kpọmkwem n’ọganihu nke ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ? A na-emekwa ihe dị ukwuu n’ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ala Mgbakọ, na ihe owuwu alaka ndị dị na gburugburu ụwa, bụ́ ebe a na-achọsi ịdị njikere ịrụ ọrụ ike. A na-enwe ekele dị ukwuu n’ebe ndị nyeworo onwe ha maka ọrụ ọma ndị a nọ, a gọziwokwa ha n’ụzọ bara ụba!—Luk 6:38.
5 Ndị a bụ oge obi ụtọ. Jehova, site ná mmụọ ya, ji ndị ya na-enye onwe ha n’afọ ofufo arụzu ọrụ dị ịtụnanya n’elu ala! Mgbe ọ bụla Jehova, site ná nzukọ ya, kpọrọ òkù ikere òkè n’ọrụ Alaeze a mụbawanyere, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘M̀ ka na-enye onwe m n’afọ ofufo?’ Mgbe ahụ anyị kwesịrị iji ekpere nyochaa obi na ọnọdụ anyị. Nsọpụrụ Chineke anyị ga-akwali anyị ime ihe nile anyị pụrụ ime n’ije ozi dị nsọ, wee si otú a na-eme ka obi Jehova nwee ọṅụ dị ukwuu!—Zef. 3:17.