Zefanaya
3 Obodo a nke na-enupụ isi, nke rụkwara arụ ma na-emegbu ụmụ amaala ya, ga-ata ahụhụ.+
2 Ọ naghị ege ntị.+ Ọ naghị anabata aka ná ntị a na-adọ ya.+
Ọ tụkwasịghị Jehova obi.+ Ọ naghịkwa abịa Chineke ya nso.+
3 Ndị isi ya bụ ọdụm na-agbọ ụja.+
Ndị na-ekpe ikpe na ya bụ anụ ọhịa wolf ndị na-achụ nta anụ ná mgbede.
Tupu ụtụtụ eruo, ha na-atachapụ ọkpụkpụ niile.
4 Ndị amụma ya na-akparị mmadụ, na-aghọkwa aghụghọ.+
Ndị nchụàjà ya na-emerụ ihe dị nsọ.+
Ha na-emebi iwu.+
5 Jehova bụ onye ezi omume, nọrọkwa n’obodo ahụ.+ Ọ naghị eme ihe ọjọọ ọ bụla.
N’ụtụtụ ọ bụla, ọ na-eme ka a mara ikpe ziri ezi ọ na-ekpe.+
Ọ naghị ahapụ ime ya otú ahụ chi na-anaghị ahapụ ịbọ.
Ma ihere anaghị eme onye ajọ omume.+
6 “M bibiri mba dị iche iche. M mekwara ka ụlọ nche ndị dị n’isi isi mgbidi ha tọgbọrọ nkịtị.
M lara okporo ámá ha n’iyi, nke mere na o nweghị onye na-esi na ya agafe.
Obodo ha dị iche iche bụzi ikpo nkume, nke mere na mmadụ afọdụghị na ha, o nweghịkwa onye bi na ha.+
7 M sịrị, ‘Tụọ egwu m, nabatakwa aka ná ntị m na-adọ gị,’*+
Ka a ghara ibibi ebe i bi,+
N’ihi na m ga-eme ka ị zaa ajụjụ* maka ihe ndị a niile.
Ma, ime ihe ọjọọ na-agụsi ha agụụ ike.+
N’ihi na m kpebiri ịchịkọta mba dị iche iche na ịchịkọta alaeze dị iche iche,
Iji wesa ha iwe m, wesakwa ha iwe m dị ọkụ.+
N’ihi na iwe m dị ka ọkụ, ọ ga-erepịakwa ụwa niile.+
9 N’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka m ga-agbanwe asụsụ ndị dị iche iche ka ọ bụrụ asụsụ dị ọcha,
Ka ha niile wee na-akpọ aha m bụ́ Jehova
Ma jiri otu obi na-efe m ofufe.’+
10 Ndị na-arịọsi m arịrịọ ike, ya bụ, ndị m a chụsara achụsa,
11 N’ụbọchị ahụ, a gaghị emenye gị ihere
N’ihi isi niile i nupụụrụ m,+
Maka na ọ bụ mgbe ahụ ka m ga-esi n’ime gị wepụ ndị gị dị mpako.
Ị gaghịzi adị mpako n’ugwu m dị nsọ.+
12 M ga-ahapụ ndị dị umeala n’obi na ndị dị nwayọọ ka ha dịrị ndụ.+
Ha ga-agbakwutekwa mụnwa bụ́ Jehova ka m chebe ha.*
13 Ndị fọdụrụ n’Izrel+ agaghị eme ihe ọjọọ.+
Ha agaghị agha ụgha. Ha agaghịkwa eji ọnụ ha ghọgbuo mmadụ.
Ha ga-eriju afọ ma dinara ala. E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ.”+
14 Ndị bi na Zayọn,* tienụ mkpu ọṅụ.
Ndị Izrel, tienụ mkpu aṅụrị.+
Ndị bi na Jeruselem,* jirinụ obi unu niile ṅụrịa ọṅụ, nweekwanụ obi ụtọ.+
15 Jehova akagbuola ikpe a mara unu.+
Ọ chụpụla ndị iro unu.+
Eze Izrel, bụ́ Jehova, nọnyeere unu.+
Unu agaghịzi atụ egwu ọdachi.+
16 N’ụbọchị ahụ, a ga-asị Jeruselem:
“Zayọn, unu atụla egwu.+
Unu adakwala mbà.*
17 Jehova bụ́ Chineke unu nọnyeere unu.+
Ọ bụ Dike, ọ ga-azọpụtakwa unu.
Ọ ga-aṅụrị ezigbo ọṅụ n’ihi unu.+
Afọ ga-eju ya maka na ọ hụrụ unu n’anya.
Ọ ga-aṅụrị ọṅụ, tiekwa mkpu ọṅụ n’ihi unu.
18 M ga-akpọkọta ndị na-eru uju maka na ha anọghị n’oge ememme unu.+
Ha anọghị ebe unu nọ n’ihi na ha nọ n’ala ọzọ na-edi nkọcha a na-akọcha ha.+
19 N’oge ahụ, m ga-emesi ndị niile na-emegbu unu ike.+
M ga-azọpụtakwa onye na-ete ụkwụ.+
M ga-akpọkọtakwa ndị a chụsara achụsa.+
M ga-eme ka a na-eto ha, aha ha ana-edekwa ude
N’ala niile e menyere ha ihere.
20 N’oge ahụ, m ga-akpọlata unu.
N’oge ahụ, m ga-akpọkọta unu.