Nzukọ Ije Ozi Maka December
Izu Na-amalite December 2
Abụ 134 (64)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
15 min: “Ònye Ga-ege Ntị n’Ozi Anyị?” Ajụjụ na azịza. Gụnye isi ihe ndị sitere na Teta! August 8, 1988, peji nke 13, nke dabeere n’ihe mere ozi anyị ji adọrọ adọrọ.
20 min: “Okwu Chineke Na-enye Nduzi.” (Paragraf nke 1-6) Jiri paragraf nke 1-2 malite ihe omume. (Gụnye akwụkwọ Reasoning, peji nke 58-60, na-akọwapụta ná mkpirikpi ihe anọ bụ́ “Ihe mere a ga-eji na-atụle Bible.”) Mee ka ndị nkwusa ruru eru mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a tụrụ aro ha na paragraf nke 3-6. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ka ha kwuo okwu na (1) otú ajụjụ ndị e welitere ji nye aka ịkpalite mmasị, (2) otú akụkụ akwụkwọ nsọ e ji mee ihe si kwekọọ n’isiokwu a na-ekwurịta, (3) otú nletaghachi si sochie nkwurịta okwu nke mbụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, na (4) otú e si kwuo ka e nwee ọmụmụ ihe.
Abụ 75 (74) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite December 9
Abụ 100 (50)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Rụtụ aka n’isi ihe ụfọdụ a pụrụ iji kwuo okwu dị na magazin ndị ọhụrụ ndị a pụrụ iji jee ozi n’izu a.
15 min: Inyere Ndị Agadi Aka Ikere Òkè n’Ozi. Ọtụtụ ndị nkwusa na-ekwesị ntụkwasị obi meworo agadi nwere ọchịchọ siri ike isoro ọgbakọ na-eme nkwusa, ma ha nwere erughị eru elu ahụ ndị bụ n’ihi ịka nká na ahụ esighị ike. E nwere ụzọ ndị anyị pụrụ isi gosi ha nchebara echiche iji wee gụnye ha n’ìgwè ije ozi: Kwuo na ị ga-eburu ha; mee ndokwa ka ha rụọ n’ebe obibi ndị ha na-agaghị arị ọtụtụ stepụ; dọta ụgbọala nso ka ha wee nwee ike izuru ike mgbe ike gwụrụ ha; kwuo na ị ga-akwọga ha ná nletaghachi ha; mee ka ha mata na ị ga-ebula ha mgbe ha chere na ha agaghị enwe ike ịga n’ihu. Ndị agadi na-enwe ekele maka aka e nyeere ha. Kwuo ụzọ ndị ọzọ unu si egosi nchebara echiche dị otú ahụ n’ọgbakọ. Tụleghachi isi ihe ndị dị n’isiokwu bụ́ “Anyị Nwere Ekele Maka Ndị Agadị!” nke dị n’Ụlọ Nche June 1, 1986, peji nke 28-29.
20 min: “Okwu Chineke Na-enye Nduzi.” (Paragraf nke 7-9) Kwuo okwu ná “Mkpa Maka Nduzi” n’Ụlọ Nche May 1, 1993, peji nke 3. Kọwaa ihe mere ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ anyị kwesịrị iji mesie ike mkpa nke ịchọ enyemaka site n’ebe ka elu—Chineke. Mee ka onye nkwusa mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị dị na paragraf nke 7-8. Mesie ike na ihe mgbaru ọsọ anyị kwesịrị ịbụ imesị malite ọmụmụ Bible n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.
Abụ 197 (24) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite December 16
Abụ 209 (57)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụọ arọ ụfọdụ banyere otú e si eji akọ azaghachi ekele oge ezumike. Kọwapụta ndokwa pụrụ iche e mere maka ozi ubi na December 25.
15 min: “Inye Onwe Anyị n’Afọ Ofufo.” Ajụjụ na azịza. Gụnye okwu ndị sitere n’Ụlọ Nche November 1, 1984, peji nke 22.
20 min: “Ịṅụrị Ọṅụ ná Mmụba Chineke Na-enye.” Okwu na-ekpo ọkụ nke onye okenye ga-ekwu. Hota ahụmahụ ma ọ bụ ihe àmà nke mmụba ná mba ndị e gosipụtara, dị ka e gosipụtara na Yearbook ndị kasị ọhụrụ.
Abụ 41 (22) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite December 23
Abụ 93 (48)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Gụpụta ndokwa pụrụ iche e mere maka ozi ubi na January 1.
15 min: Mkpa ọgbakọ. Ma ọ bụ onye okenye ekwuo okwu ‘n’Ezumike Nká—Ọ̀ Bụ Ọnụ Ụzọ Ghere Oghe Maka Ọrụ Ọchịchị Chineke?’ site n’Ụlọ Nche July 15, 1996, peji nke 24-25.—Lee Insight, Mpịakọta nke 2, peji nke 794, paragraf nke 2-3.
20 min: “Ndeba Aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.” Okwu onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu. Kwuo ndekọ ọnụ ọgụgụ e nwere n’ọgbakọ, gbaakwa ndị nile nwere ike ume ideba aha. Tụleghachi ntụziaka maka ihe omume ndị mmụta nke dị ‘n’Usoro Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1997.’
Abụ 166 (90) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite December 30
Abụ 223 (55)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu eruwo ịgbanwe oge nzukọ ya maka afọ ọhụrụ, nye agbamume obiọma, na-agwa mmadụ nile ka ha nọgide na-agachi nzukọ ọgbakọ anya n’oge ọhụrụ ya.
15 min: Tụlee “Kwusaa Alaeze Ahụ.” Gụọ paragraf nile.
20 min: Tụleghachi Akwụkwọ A Ga-enyefe na January. Nyefee Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. N’iji akwụkwọ Reasoning, peji nke 9-14 eme ihe, tụleghachi ná mkpirikpi okwu mmalite ndị kwesịrị ekwesị maka akwụkwọ nke ọ bụla. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ.
Abụ 137 (3) na ekpere mmechi.