Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/96 p. 4-5
  • Ịṅụrị Ọṅụ ná Mmụba Chineke Na-enye

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịṅụrị Ọṅụ ná Mmụba Chineke Na-enye
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onyinye Maka Ọrụ Society Gburugburu Ụwa Na-akwado Mgbasawanye
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ha Na-ejere Òtù Ụmụnna Ndị Kraịst Ozi ná Mba Ndị Ọzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ịrụ Ụlọ Ndị E Ji Na-eto Jehova
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 12/96 p. 4-5

Ịṅụrị Ọṅụ ná Mmụba Chineke Na-enye

1 Ndị Kraịst na narị afọ mbụ bụ ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi. Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ‘ọnụ ọgụgụ ọgbakọ babigara ụba ókè kwa ụbọchị.’ (Ọrụ 16:5) Nkwusa ha ji nkwuwa okwu mee gbasara banye n’Esia, Europe, na Africa, na-akpata iwe ihe ubi bara ụba nke ndị kwere ekwe.

2 Jisọs buru amụma na na mgbe ikpeazụ, ọrụ nkwusa ahụ ga-eru ‘elu ụwa dum mmadụ bi, ruokwa mba nile’! (Mat. 24:14) N’ime afọ ije ozi 1996, anyị nọgidere na-anata akụkọ banyere mmụba ndị dị ebube na ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke ndị nkwusa site n’ala ndị dị gburugburu ụwa. E guzobewo ọtụtụ ọgbakọ ọhụrụ. Oké uto a emewo ka ọ dị mkpa iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ ndị ọhụrụ tinyekwara iwusawanye ọtụtụ ihe owuwu alaka.

3 Ozi Alaeze Anyị nke August 1996 kọrọ banyere ọrụ owuwu ihe sara mbara na-ewere ọnọdụ n’Africa. Ọrụ yiri nke ahụ na-agakwa n’ihu na Latin America nile. Maka afọ ije ozi 1996, Mexico nyere akụkọ ọnụ ọgụgụ kasị elu dị ịtụnanya nke ndị nkwusa 470,098 na nkezi nke ọmụmụ Bible 600,751, nke mere ka e guzobe ọgbakọ 466 ọhụrụ! E mere ndokwa imesị mwusawanye nke ihe owuwu alaka ha ná ngwụsị 1999. Uto yiri nke ahụ e nwere n’ọtụtụ mba ndị ọzọ adịghị enye ohere maka ịda mbà n’ụdị dị iche iche nke ọrụ ihe owuwu nke ọchịchị Chineke.

4Ọnụ ahịa ihe owuwu dị elu n’ebe nile, n’ọtụtụ ala ụmụnna anyị nwekwara ihe dị nta inye n’ụzọ ihe onwunwe. Ma, n’oké ịnụ ọkụ n’obi ha maka ozi Jehova, ha na-eto eto n’ezie n’ụzọ ime mmụọ ma na-amụba n’oké ọnụ ọgụgụ. Ilu 28:27 na-emesi anyị obi ike na “onye na-enye ogbenye ihe, ihe adịghị akọ ya.” Njikere anyị dị n’inye aka ịkwụ ụgwọ ego e ji ewu ndị a na-eme ka e nwee “nhata” nke ihe onwunwe, na-eme ka mmadụ nile nwee ike inweta obi ụtọ nke na-abịa site n’inye ihe na ọṅụ na-abịa site n’ịhụ mmụba Jehova na-enye!—2 Kọr. 8:14, 15; Ọrụ 20:35.

[Foto dị na peeji nke 4]

Alaka Paraguay

[Foto dị na peeji nke 4]

Alaka Ecuador

[Foto dị na peeji nke 4, 5]

Mgbakwụnye Mexico A Ka Na-ewu Ewu

[Foto dị na peeji nke 4, 5]

Alaka Dominican Republic

[Foto dị na peeji nke 4]

Alaka Brazil na Mgbakwụnye Ya

[Foto dị na peeji nke 4, 5]

Alaka Uruguay A Ka Na-ewu Ewu

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Ụdị Ụlọ Nzukọ Alaeze na-adịghị ewe oké ego na Latin America

1. Brazil

2. Nicaragua

3. Chile

4. Colombia

5. Mexico

6. Brazil

7. Peru

8. Venezuela

9. Mexico

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya