Ilu
28 Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe a na-enweghị onye na-achụ ha,
Ma obi na-esi ndị ezi omume ike ka ọdụm.+
2 Mgbe ndị obodo na-emebi iwu, otu onyeisi chịtụ, ibe ya anọchie ya.+
Ma ọ bụrụ na e nwere onye na-aghọta ihe nke ma ihe, otu onyeisi ga-achịte aka.+
3 Ogbenye nke na-erigbu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya+
Dị ka mmiri ozuzo nke na-eburu nri niile bufuo.
8 Onye na-anara ọmụrụ nwa ma na-aghọ aghụghọ ka o wee kpatakwuo akụ̀+
Na-akpakọtara ya onye na-emere ndị ogbenye amara.+
10 Onye na-eduhie ndị ezi omume ka ha wee mewe ihe ọjọọ ga-adaba n’olulu o gwuru,+
Ma ihe ọma ga-abịara ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta.+
11 Ọgaranya na-eche na ya ma ihe,+
Ma ogbenye nke na-aghọta ihe ga-achọpụta ụdị onye ọgaranya ahụ bụ.+
13 Ihe agaghị agaziri onye na-ezochi mmehie ya,+
Ma a ga-emere onye ọ bụla kwupụtara mmehie ya ma hapụ ya ebere.+
14 Onye na-akpachapụ anya* mgbe niile na-enwe obi ụtọ,
Ma onye na-akpọchi obi ya ga-adaba ná nsogbu.+
15 Onye ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka
Dị ka ọdụm na-agbọ ụja na anụ ọhịa bea nke ji ọsọ na-aga ịdọri anụ.+
16 Onye ndú nke na-enweghị uche na-emegbu ndị ọ na-edu,+
Ma onye kpọrọ uru e ji aghụghọ erite asị ga-adịte ndụ aka.+
17 Onye ikpe ọbara mara maka na o gburu mmadụ ga-agbagide ọsọ ruo mgbe ọ banyere n’ili.*+
Ya enwela onye ga-akwado ya.
19 Onye na-akọ ubi ya ga-enweju ihe oriri enweju,
Ma onye na-achụ ihe na-abaghị uru ga-ada ezigbote ogbenye.+
20 Ọtụtụ ngọzi ga-abịara onye a tụkwasịrị obi,+
Ma onye na-achọ ka ọ baa ọgaranya ngwa ngwa ga-etinyerịrị aka n’ihe ọjọọ.+
21 Ile mmadụ anya n’ihu adịghị mma.+
Ma mmadụ nwere ike ime ihe ọjọọ n’ihi otu ibé achịcha.
24 Onye na-ezu nne ya na nna ya ohi ma na-asị, “Ọ bụghị ihe ọjọọ,”+
Ya na onye na-ala ihe n’iyi bụ otu.+
26 Onye tụkwasịrị onwe ya* obi dị nzuzu,+
Ma onye na-akpa àgwà otú gosiri na ọ ma ihe agaghị abanye ná nsogbu.+
27 E nweghị ihe ga-akọ onye na-enye ogbenye ihe.+
Ma onye na-eme anya ka à ga-asị na ọ naghị ahụ ogbenye, a ga-abụ ya ọnụ.