Wulitenụ Ibe Unu Elu Site n’Ịza Ajụjụ ná Nzukọ
1 A gbara anyị ume ná Ndị Hibru 10:24 ‘ịkpasurịta ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche n’ime ibe anyị.’ Nke a na-agụnye iwulite ibe anyị elu site n’ịza ajụjụ ndị dị mma ná nzukọ ọgbakọ. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zaa ajụjụ? Olee otú anyị pụru isi mee nke a? Olee ndị ga-erite uru?
2 Chee echiche banyere ọtụtụ mgbe ị na-erite uru site n’ịnụ ka ndị ọzọ na-aza ajụjụ ndị dị mfe, ndị doro anya bụ́ ndị na-eme ka i nwekwuo nghọta ma na-ewusi gị ike n’ụzọ ime mmụọ. I nwere ihe ùgwù imere ha otu ihe ahụ. Mgbe ị na-ekere òkè, ị na-egosipụta ọchịchọ gị ‘ime ka e keta onyinye amara ụfọdụ nke Mmụọ Nsọ’ iji gbaa ndị nile bịaranụ ume.—Rom 1:11, 12.
3 Ụzọ Isi Nye Azịza Ndị Dị Mma: Ekwula ogologo okwu, na-ekwuzu ihe nile dị na paragraf. Ogologo okwu adịkebeghị enye azịza a kapịrị ọnụ kpọmkwem, ọ pụkwara ịkụda ndị ọzọ aka ikere òkè. Azịza nke mbụ na paragraf kwesịrị ịdị mkpirikpi, bụru azịza gara kpọmkwem nye ajụjụ ahụ e biri ebi. Ndị na-atụkwasị ihe n’azịza ahụ pụziri ịkọwa ụzọ dị irè a pụrụ isi tinye ihe a na-atụle n’ọrụ ma ọ bụ gosi otú akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche si metụta ihe a na-atụle. Lee Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 106-108.
4 Ọ bụrụ na echiche nke inye azịza na-akpatatụrụ gị nchegbu, buru ụzọ kwadebe azịza dị mkpirikpi, gwakwa onye nduzi ka ọ kpọọ gị na paragraf ahụ. Mgbe i mere nke a ná nzukọ ole na ole, ikere òkè ga-adị mfe karị. Cheta na Mosis na Jeremaịa kwuru na ha enweghị obi ike n’ikike ha nwere ikwu okwu n’ihu ọha. (Ọpụ. 4:10; Jer. 1:6, nkọwa ala ala peji nke NW) Ma Jehova nyeere ha aka ikwu okwu n’aha ya, ọ ga-enyekwara gị aka.
5 Olee Ndị Ga-erite Uru n’Azịza Gị? Gị onwe gị na-erite uru n’ihi na azịza gị na-eme ka eziokwu ahụ bamie n’uche na obi gị karị, na-eme ka ọ dịrị gị mfe karị icheta ihe ọmụma ahụ mgbe e mesịrị. Ọzọkwa, ndị ọzọ na-erite uru site n’ịnụ azịza gị na-ewuli elu. A na-agba anyị ume mgbe mmadụ nile, ma hà bụ ndị nweworo ahụmahụ, ndị na-eto eto, ndị na-eme ihere, ma ọ bụ ndị ọhụrụ, na-agbalị ikwupụta okwukwe ha ná nzukọ ọgbakọ.
6 Anyị ga-achọpụta n’ezie na ‘okwu e kwuru na mgbe ya, na-ama mma nke ukwuu’ mgbe anyị ji ha na-ewulite ibe anyị elu ná nzukọ!—Ilu 15:23.