Ilu
3 Anya Jehova na-ahụ ihe niile.
Ọ na-ahụ ma ndị ọma ma ndị ọjọọ.+
10 Onye na-achọghị ịnọ n’ezigbo ụzọ na-ewere aka ná ntị a na-adọ ya ka ihe ọjọọ,*+
Ma onye kpọrọ mba a na-abara ya asị ga-anwụ.+
11 Ebe ọ bụ na Jehova na-ahụ ndị nọ n’ili* nakwa ebe ndị mmadụ na-anọ erekasị,*+
O doro anya na ọ na-ahụ ihe dị ndị mmadụ n’obi.+
12 Onye na-akwa mmadụ emo anaghị ahụ onye na-abara ya mba* n’anya.+
Ọ gaghị agakwuru ndị ma ihe ka ha dụọ ya ọdụ.+
13 Ọ bụrụ na obi dị mmadụ mma, ihu na-abụ ya ọchị ọchị,
Ma ike na-agwụ mmadụ ma ọ bụrụ na obi adịghị ya mma.+
15 Ụbọchị niile na-abụrụ onye na-ata ahụhụ* nsogbu nsogbu,+
Ma onye obi na-adị mma na-enwe obi ụtọ mgbe niile.+
17 Ọ ka mma na ndị mmadụ na-eri naanị akwụkwọ nri ma hụ ibe ha n’anya+
Kama ịna-ata anụ ehi gbara agba ma kpọọ ibe ha asị.+
18 Onye na-ewe iwe ọkụ na-akpata esemokwu,+
Ma onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ na-eme ka esemokwu bie.+
22 Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu,
Ma a na-arụpụta ezigbo ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.+
24 Onye na-aghọta ihe na-aga n’ụzọ na-agbago agbago nke na-eduga ná ndụ.+
Ọ naghị abanye n’ụzọ na-agbada agbada nke na-eduga n’ili.*+
27 Onye ji aghụghọ akpa akụ̀ na-akpatara ezinụlọ ya nsogbu,*+
Ma onye kpọrọ ịnara aka azụ asị ga na-adị ndụ.+
30 Ihu ọchị na-eme ka obi dị mmadụ ụtọ.
Akụkọ dị mma na-eme ka mmadụ nwee ume.*+
32 Onye ọ bụla nke na-anaghị anabata aka ná ntị a na-adọ ya kpọrọ ndụ ya asị,+
Ma onye ọ bụla nke na-anabata mba a na-abara ya na-aghọta ihe.+
33 Ọ bụrụ na mmadụ na-atụ egwu Jehova, ọ ga-amụta otú ọ ga-esi na-akpa àgwà ka onye ma ihe.+
Mmadụ ga-ebukwa ụzọ dị umeala n’obi tupu a kwanyere ya ùgwù.+