Jeremaya
1 Ọ bụ Jeremaya* nwa Hilkaya, bụ́ otu n’ime ndị nchụàjà n’Anatọt,+ n’ala Benjamin, kwuru ihe ndị a. 2 Jehova gwara m okwu n’afọ nke iri na atọ n’ọchịchị Josaya+ nwa Emọn,+ bụ́ eze Juda. 3 Chineke gwakwara m okwu n’oge Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, na-achị. Ọ gwagidere m okwu ruo n’afọ nke iri na otu n’ọchịchị Zedekaya+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, ruokwa mgbe a dọọrọ ndị bi na Jeruselem n’agha n’ọnwa nke ise.+
4 Jehova gwara m, sị:
5 “Tupu mụ akpụọ gị n’ime afọ, ama m* gị.+
Tupu a mụọ gị,* edoro m gị nsọ.*+
Ahọpụtara m gị ka ị na-ebu amụma gbasara mba dị iche iche.”
6 Ma m sịrị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova!
Amaghị m okwu ekwu,+ n’ihi na abụ m nwata.”+
7 Jehova wee sị m:
“Asịla na ị bụ nwata.
Kama, gakwuru ndị niile m ga-ezi gị ka ị gakwuru,
Kwuokwa ihe niile m ga-asị gị kwuo.+
8 Mụnwa, bụ́ Jehova, na-agwa gị ka ị ghara ịtụ ihu ha ụjọ,+
N’ihi na anọnyeere m gị ka m napụta gị.”+
9 Jehova wee matịa aka ya metụ m n’ọnụ.+ Jehova gwakwara m, sị: “Etinyela m okwu m n’ọnụ gị.+ 10 Enyefeela m mba dị iche iche na alaeze dị iche iche n’aka gị. Ị ga na-efopụ ihe e kwesịrị ifopụ, na-akwada ihe e kwesịrị ịkwada, na-ebibi ihe e kwesịrị ibibi, na-etida ihe e kwesịrị itida, na-arụ ihe e kwesịrị ịrụ, na-akụkwa mkpụrụ e kwesịrị ịkụ.”+
11 Jehova gwakwara m okwu ọzọ, sị: “Jeremaya, gịnị ka ị na-ahụ?” Mụ asị ya: “M na-ahụ alaka osisi almọnd.”*
12 Jehova wee sị m: “Ị hụziri ya ahụzi, n’ihi na m mụ nnọọ anya iji mezuo ihe m kwuru.”
13 Jehova gwakwara m okwu nke ugboro abụọ, sị: “Gịnị ka ị na-ahụ?” Mụ asị ya: “M na-ahụ ite* nke ihe dị na ya na-agbọ agbọ,* ọnụ ya echeghịkwa ihu n’ebe ugwu.” 14 Jehova wee sị m:
“Ọdachi ga-esi n’ebe ugwu
Dakwasị ndị niile bi n’ala a.+
15 Jehova kwuru, sị, ‘M na-akpọkọta ezinụlọ niile si n’alaeze ebe ugwu.+
Ha niile ga-abịa. Eze nke ọ bụla n’ime ha ga-ebusakwa ocheeze ya
N’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.+
Ha ga-etida mgbidi ya niile gbaa gburugburu,
Lụsokwa obodo niile dị na Juda agha.+
16 M ga-ama ndị m ikpe n’ihi ihe ọjọọ niile ha na-eme,
N’ihi na ha ahapụla m,+
Na-achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà a na-esu ọkụ,+
Na-akpọkwara ọrụ aka ha isiala.’+
17 Ma gịnwa, jikere ime ihe i kwesịrị ime.*
Gaa gwa ha ihe niile m ga-agwa gị ka ị gwa ha.
Atụla ha ụjọ,+
Ka m ghara ime ka ụjọ jide gị n’ihu ha.