Ọpụpụ
4 Ma Mosis zara, sị: “Ọ bụrụkwanụ na ha ekwetaghị ihe m kwuru ma ghara ige m ntị?+ N’ihi na ha ga-asị, ‘Jehova apụtaghị n’ihu gị.’” 2 Jehova wee sị ya: “Gịnị bụ ihe ahụ i ji n’aka?” Ọ zara, sị: “Ọ bụ mkpara.” 3 Ọ sịrị: “Tụpụ ya n’ala.” O wee tụpụ ya n’ala, ya aghọọ agwọ.+ Mosis wee gbaara ya ọsọ. 4 Jehova gwara Mosis, sị: “Matịa aka gị jide ya n’ọdụ.” O wee matịa aka jide ya, ya aghọọ mkpara n’aka ya. 5 Chineke sịziri ya: “Ihe a ga-eme ka ha kwere na Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha, Chineke Ebreham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb,+ pụtara n’ihu gị.”+
6 Jehova gwara ya ọzọ, sị: “Biko, tinye aka gị n’ime uwe gị.” O tinyere aka ya n’uwe ya. Mgbe o wepụtara ya, ekpenta mere ya n’aka, aka ya ana-acha ezigbo ọcha.+ 7 O wee sị ya: “Tinyeghachi aka gị n’ime uwe gị.” O tinyeghachiri aka ya n’uwe ya. Mgbe o wepụtara ya n’uwe ya, ọ dịghachiri mma ka ebe ndị ọzọ n’ahụ́ ya. 8 Ọ sịrị Mosis: “Ọ bụrụ na ha ekwetaghị ihe i kwuru ma ọ bụ ghara ikweta ihe àmà mbụ ahụ, ha ga-ekweta ihe àmà+ nke abụọ. 9 Ma ọ bụrụ na ha ekwetaghị ihe àmà abụọ ndị a ma ghara ige gị ntị, ị ga-ekute mmiri n’Osimiri Naịl wụsa ya n’ala. Mmiri ahụ i kutere n’Osimiri Naịl ga-aghọ ọbara n’ala.”+
10 Mosis sịziri Jehova: “Biko, Jehova, e nweghị mgbe okwu na-aga m were were n’ọnụ, ma n’oge gara aga ma kemgbe ị gwara ohu gị okwu, n’ihi na ikwu okwu na-esiri m ike, ire na-anyịkwa m arọ.”+ 11 Jehova sịrị ya: “Ònye nyere ndị mmadụ ọnụ, ma ọ bụ ònye na-eme ka ha ghara ikwu okwu, ka ntị chie ha, ka ha na-ahụ ụzọ nke ọma, ma ọ bụ ka ha kpuo ìsì? Ọ́ bụghị mụnwa bụ́ Jehova? 12 N’ihi ya, gawa, m ga-anọnyere gị mgbe ị na-ekwu okwu, m ga-akụzikwara gị ihe ị ga-ekwu.”+ 13 Ma ọ sịrị: “Ewela iwe, Jehova, biko ziga onye ọ bụla ọzọ ị chọrọ iziga.” 14 Jehova wee wesa Mosis ezigbo iwe ma sị ya: “Oleekwanụ maka Erọn nwanne gị+ onye Livaị? Ama m na ọ na-ekwu okwu nke ọma. Ọ na-abịakwa izute gị. Mgbe ọ ga-ahụ gị, obi ga-adị ya ụtọ.+ 15 N’ihi ya, ị ga-agwa ya okwu ma tinye okwu ndị ahụ n’ọnụ ya.+ M ga-anọnyere gị na ya mgbe ị ga na-ekwu okwu,+ m ga-akụzikwara unu ihe unu ga-eme. 16 Ọ ga na-agwara gị ndị m okwu. Ọ ga-abụ ọnụ na-ekwuchitere gị. Ị ga-abụrụ ya Chineke.*+ 17 Ị ga-ejikwa mkpara a n’aka gị ka i jiri ya mee ihe àmà ndị ahụ.”+
18 Mosis wee gakwuru Jetro nna nwunye ya+ ma sị ya: “Biko, achọrọ m ịla, ka m lakwuru ụmụnne m ndị nọ n’Ijipt, ka m mara ma hà ka dịkwa ndụ.” Jetro sịrị Mosis: “Laa n’udo.” 19 Mgbe e mechara, Jehova gwara Mosis okwu na Midian, sị: “Gawa, laghachi n’Ijipt, n’ihi na ndị niile na-achọ igbu gị* anwụọla.”+
20 Mosis wee kpọrọ nwunye ya na ụmụ ya ma kukwasị ha n’elu jakị. O wee laghachiwa Ijipt. Mosis jikwa mkpara ezi Chineke n’aka ya. 21 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Ọrụ ebube niile m nyere gị ike ịrụ, hụ na ị rụrụ ha n’ihu Fero ma ị laghachi n’Ijipt.+ Ma m ga-ekwe ka obi ya kpọchie,+ ọ gaghịkwa ahapụ ndị m ka ha laa.+ 22 Gwa Fero, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Izrel bụ nwa m nwoke, ọkpara m.+ 23 Ana m asị gị, Hapụ nwa m nwoke ka ọ gaa fee m.* Ma ọ bụrụ na i kweghị ahapụ ya, m ga-egbu nwa gị nwoke, ọkpara gị.”’”+
24 Mgbe ha nọ n’ụzọ, n’ebe ha ga-arahụ, Jehova+ zutere ya ma chọwa igbu ya.+ 25 N’ikpeazụ, Zipora+ weere nkume dị nkọ bie nwa ya nwoke úgwù ma mee ka apị́ ya metụ n’ụkwụ ya wee sị: “Ọ bụ maka na ị bụụrụ m di ọbara.” 26 O wee hapụ ya. N’oge ahụ, Zipora sịrị, “di ọbara,” n’ihi úgwù ahụ o biri ya.
27 Jehova wee gwa Erọn, sị: “Gakwuru Mosis n’ala ịkpa.”+ O wee gaa zute ya n’ugwu ezi Chineke+ ma susuo ya ọnụ.* 28 Mosis gwara Erọn ihe niile Jehova, onye zitere ya, kwuru,+ gwakwa ya ihe àmà niile o nyere ya iwu ka o mee.+ 29 Mgbe e mechara, Mosis na Erọn gara kpọkọta ndị niile bụ́ ndị okenye Izrel.+ 30 Erọn gwara ha ihe niile Jehova gwara Mosis, o mekwara ihe àmà ndị ahụ+ n’ihu ha. 31 Ndị ahụ wee kwere.+ Mgbe ha nụrụ na Jehova echetala ndị Izrel+ nakwa na ọ hụla otú e si na-emekpa ha ahụ́,+ ha hulatara ala kpọọ isiala.