Zụọ Ụmụ Gị Ka Ha Bụrụ Ndị Ozi
1. Gịnị ka Abụ Ọma 148:12, 13 kwesịrị ime ka ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst mee?
1 Jehova gwara ndị na-eto eto ka ha bịa too ya. (Ọma 148:12, 13) N’ihi ya, ihe ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-eme abụghị naanị ịkụziri ụmụ ha eziokwu ndị dị na Baịbụl na àgwà ọma Chineke chọrọ ka ha na-akpa, ha na-azụkwa ha ka ha ghọọ ndị ozi nke ozi ọma. Olee otú ha nwere ike isi jiri nwayọọ nwayọọ mee nke a?
2. Olee otú ezigbo ihe nlereanya ndị nne na nna si emetụta ụmụ ha?
2 Bụrụ Ezigbo Ihe Nlereanya: Gidiọn onyeikpe gwara narị ndị ikom atọ ya, sị: “Mụtanụ ihe site n’ile m anya.” (Ikpe 7:17) Ụmụaka na-emekarị ihe ha hụrụ ndị mụrụ ha na-eme. E nwere otu nna na-arụ ọrụ abalị. Ọ lọta ọrụ n’ụtụtụ Satọdee, kama ihiwe ụra, ọ na-akpọrọ ụmụ ya gawa ozi ọma n’agbanyeghị na ezigbo ike gwụrụ ya. Ọ na-esi otú ahụ akụziri ụmụ ya na ozi ọma bụ ọrụ kacha mkpa. (Mat. 6:33) Ụmụ gị hà na-ahụ gị ka i ji ọṅụ na-eme ihe ndị dị iche iche a na-eme n’ofufe Chineke, dị ka ikpe ekpere, ịgụ Baịbụl, ịza ajụjụ, na ikwusa ozi ọma? Nke bụ́ eziokwu bụ na ị gaghị emetechali ihe niile. Ma, ụmụ gị hụ otú i si agbasi mbọ ike n’ozi Jehova, ọ ga-aka eme ka ha nwee mmasị ife Jehova.—Diut. 6:6, 7; Rom 2:21, 22.
3. Olee ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị mụrụ ụmụ kwesịrị inyere ụmụ ha aka ka ha jiri nwayọọ nwayọọ na-eru?
3 Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị E Ji Nwayọọ Nwayọọ Eru: Ike anaghị agwụ ndị mụrụ ụmụ ịkụziri ụmụ ha otú e si aga ije, ekwu okwu, eji ejiji, na otú e si eme ihe ndị ọzọ. Ka ụmụaka na-eto, ha na-enwe ihe ọhụrụ ndị ha ga-eme. Ọ bụrụ na ndị mụrụ ha bụ Ndị Kraịst, ha na-enyekwara ụmụ ha aka inwe ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị ha ga-eru dị ka afọ ndụ ha na ike ha hà. (1 Kọr. 9:26) Ị̀ na-akụziri ụmụ gị ịza ajụjụ n’okwu nke aka ha nakwa iji aka ha na-akwadebe ihe omume e nyere ha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? (Ọma 35:18) Ị̀ na-akụziri ha ụzọ dị iche iche anyị si ekwusa ozi ọma? Ị̀ na-agba ha ume ka ha gbalịsie ike iru eru ka e mee ha baptizim nakwa ịbanye ozi oge niile? Ị̀ na-eme ka ha na ndị ji ọṅụ na ịnụ ọkụ n’obi eje ozi ọma na-akpa, ka ndị ahụ nwee ike ịgba ha ume ịbanye ozi oge niile?—Ilu 13:20.
4. Olee uru ụmụaka na-erite ma ndị mụrụ ha bido mgbe ha dị obere kụziwere ha otú e si ezi ozi ọma?
4 Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Chineke, ị nọwo na-ezi m ihe malite n’oge m bụ nwata, ruo ugbu a, anọ m na-akọ banyere ọrụ gị dị ebube.” (Ọma 71:17) Malite mgbe ụmụ gị ka dị nnọọ obere zụwa ha ịghọ ndị ozi. Ihe ndị ị kụziiri ha mgbe ha dị obere banyere otú ha ga-esi fee Chineke ga-abara ha uru ma ha too!—Ilu 22:6.