Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Ọktoba
I kelechaa onye nwe ụlọ, jụọ ya, sị, “Ị̀ chọpụtara na ndị mmadụ anaghịzi adịte ndụ aka? [Chere ka ọ zaa.] Ì chere na otu ụbọchị anyị ga-akwụsị ịrịa ọrịa, ma malite ịdịte ndụ aka? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe Ụlọ Nche a kwuru.” Nye ya Ụlọ Nche Ọktoba 1, gị na ya tụleekwa ihe e kwuru n’ajụjụ nke mbụ dị na peeji nke 16. Gụọkwa ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Baịbụl e dere ebe ahụ. I mechazie, nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya kwuokwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Ọktoba 1
I kelechaa onye nwe ụlọ, gwa ya, sị: “Taa, ọtụtụ ndị na-arụrụ aka. Ma ndị na-azụ ahịa ma ndị na-ere ahịa na-arụrụ aka. Ndị ọchịchị na-emekwa otú ahụ. Ma, ì chere na a ga-akwụsịli ya? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Baịbụl kwuru Jizọs ga-emere ndị a na-emegbu emegbu. [Gụọ Abụ Ọma 72:12-14.] Ụlọ Nche a kwuru otú a ga-esi kwụsị ịrụrụ aka n’oge na-adịghị anya.”
Teta! Ọktoba–Disemba
I kelechaa onye nwe ụlọ, gwa ya, sị: “Nsogbu juru n’ụwa taa. Ma, ọ bụrụ na ị ga-akwụsịli ha, olee nke ị ga-achọ ịkwụsị? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl kwuru ihe mere na ụmụ mmadụ agaghị akwụsịli nsogbu ndị dị n’ụwa a. [Gụọ Jeremaya 10:23.]” Ị gụchaa, kwuo, sị, “Teta! a kwuru nsogbu ndị Chineke ga-akwụsị.”